ụdịekere | nwanyị ![]() |
---|---|
mba o sị | Naijiria ![]() |
aha enyere | Adaobi, Tricia ![]() |
aha ezinụlọ ya | Nwaubani ![]() |
ụbọchị ọmụmụ ya | 1976 ![]() |
Ebe ọmụmụ | Enúgwu ![]() |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | English, pidgin Naịjirịa ![]() |
ọrụ ọ na-arụ | ode akwukwo ifo, odee akwụkwọ, onye ntaakụkọ ![]() |
ụdị ọrụ ya | oru nta akuko, literature ![]() |
ebe agụmakwụkwọ | University of Ibadan, Federal Government Girls College Owerri ![]() |
Ebe obibi | Abuja ![]() |
Ọrụ ama ama | I Do Not Come To You By Chance, Buried Beneath the Baobab Tree ![]() |
Ihe nrite | Commonwealth Writers' Prize, Betty Trask Award, Ihe nrite Wole Soyinka maka edemede n'Africa ![]() |
nnọchiaha nkeonwe | L484 ![]() |
Adaobi Tricia Obinne Nwaubani Audio bụ nwafọ Naijiria bụ onye ode akwụkwọ, ode ihe ọchị, ode edemede na onye nta akụkọ . Akwụkwọ mbido ya, I Do Not Come to you by Chance, [1] meriri n'ihe nrite nke Commonwealth Writers ’Prize for Best First Book (Africa) nke afọ 2010, [2] [3] ihe nrite nke Betty Trask First Book, [4] The Washington Post kpọkwzịrị ya otu n'ime akwukwo kacha nma nke afọ 2009. [5] Akwụkwọ mbụ ya bụ Young Adult, Buried Beneath the Baobab Tree, dabere na ajụjụ ọnụ a gbara ụmụ agbọghọ ndị Boko Haram tọọrọ, ka HarperCollins bipụtara n'ọnwa Septemba nke afọ 2018. O meriri na Raven Award for Excellence in Arts and Entertainment nke afọ 2018, akpọkwazịrị ya otu n'ime akụkọ ifo maka ndị okenye nke kachasị mma nke ndị American Library Association Best Fiction for Young Adults, bụrụkwa nke a họọrọ maka Notable Social Studies Trade Books for Young People nke afọ 2019.
A mụrụ ya n'Enugu, na Naijiria, nye Chief Chukwuma Hope Nwaubani na Dame Patricia Uberife Nwaubani n'afọ 1976, mana nne na nna Nwaubani zụlitere ya na obodo ya bụ Umuahia, [6] n'Abia Steeti, n'etiti ndị Igbo . Ezinụlọ ya sitere na ndị otu Nigerian chieftaincy system; Nna nna nna ya Chief Nwaubani Ogogo Oriaku - isi mmalite nke aha nna ya - bụ onye ahịaohu a ma ama nke Royal Niger Company na narị afọ nke iri na itoolu. [7]
Mgbe ọ dị afọ iri, ọ hapụrụ ụlọ gaa ụlọ akwụkwọ obibi nke Federal Government Girls College dị n'Owerri . Ọ gụrụ akwụkwọ maka akparamaagwa na Mahadum nke Ibadan, mahadum mbụ na Naịjirịa. [8] Dika onye na-eto eto, Nwaubani nọ na-atule ị rụ oru na CIA ma obu ndi KGB . Ọ nwetara ego mbụ ya site na mmeri n'asọmụmpi edemede mgbe ọ dị afọ 13. Nne ya bụ nwa nwanne nna Flora Nwapa, nwanyị mbụ n’Afrịka nke bipụtara akwụkwọ. [9] N’afọ mbụ ya na mahadum, ọ bụ onye otu Idia Hall Chess, ma bụrụkwa onye otu ndi otu egwu na mahadum (egwu gboo). [10]
Nwaubani bụ otu n'ime ndị bidoro ọrụ ndezi NEXT newspapers nke Naijiria nke anaghịzị arụ ọrụ ugbua, nke ọ bụ nta akụkọ Dele Olojede nke ritere onyinye Pulitzer Nrite guzobere ya . [11]
I Do Not Come to You by Chance bu akwụkwọ ọgụgụ nke izizi Nwaubani dere, nke ebiputara n’afọ 2009. [12] Nke e dere n'ụwa nke Nigerian email scams, akwụkwọ ahụ na-akọ akụkọ banyere otu nwa okorobịa, Kingsley, onye tụkwasịrị nwanne nna ya Boniface obi maka enyemaka n'ịgbapụta ezinụlọ ya n'ihe isi ike. N'afọ 2019, Masobe Books nwetara ikike i bipụta I Do Not Come to You by Chance na Naijiria. [13]
Adaobi Tricia Nwaubani bi n'Abuja, na Naijiria, ebe ọ na-arụ oru dika onye ndumodu.
Nwaubani ekwupụtala nchegbu ya banyere ọtụtụ ihe odide akwụkwọ ọgụgụ nke Afrịka. [14] Ọ na-akwanyere ọrụ akwụkwọ ọgụgụ Angela Ash nke onye edemede Irish-American bụ Frank McCourt dere,nke meriri n'ihe nrite Pulitzer site na-igosi ya na ya nwere ike iji okwu ọchị dee maka okwu siri ike. [15] Ọ bụkwa ezigbo onye nwere mmasị na onye ma=eme ihe ọchị Britain bụ P.G Wodehouse .