Adesua Etomi-Wellington, audio(help·info) nke a makwaara dị ka Adesua Etomi (amụrụ 22 Febụwarị 1988),bụ nwafọ Naijiria na-eme ihe nkiri. [1] N'afọ 2014, ọ pọtara n'ihe nkiri izizi ya Knocking On Heaven's Door . [2] O meriri Best Actress in a Drama na 2016 Africa Magic Viewers Choice Awards maka ọrụ ya na ihe nkiri ịhụnanya
A mụrụ Tolulope Adesua Etomi na Owerri, dị n'Imo Steeti, n'ụbọchị nke 22 n'ọnwa Febụwarị. [3][4] Ọtụtụ mmadụ kwuru afọ ọmụmụ ya bụ afọ 1988. [5][6][7] Agbanyeghị, n'ajụjụ ọnụ e mere na Jenụwarị n'afọ 2016, Etomi gwara Pulse Nigeria na ọ dị afọ 29. [8] Ọzọkwa, Answers Africa bipụtara otu edemede na Maachị nke afọ 2016 na-ekwu na ọ dị afọ 30. [9] Nna ya bụ onye agha nke agbụrụ Esan na nne ya bụ injinia nke agbụrụ Yoruba . [10] Ọ bụ ọdụdụ nwa n'ime ụmụnne atọ. [11] Etomi gara ụlọ akwụkwọ Corona dị na Victoria Island, na Legos, ebe o sonyere na otu ihe nkiri mgbe ọ dị afọ asaa. Mgbe nke ahụ gasịrị, ọ gara Queen's College, na Legos tupu ọ kwaga na United Kingdom mgbe ọ dị afọ 13. Etomi mechara nweta diplọma na "physical theatre, musical theatre and performing arts" na City College Coventry n'afọ 2004. Mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ ndị a n'afọ 2006 nweta distinshọn atọ, ọ mụrụ drama and performance na Mahadum nke Wolverhampton, ebe o ji fest klaasị gụchaa .
Ihe nkiri Etomi mere gụnyere Arbitration, [12]Wedding Party, [13] na Falling . [14] Omume ya na Falling nwetara ya Africa Magic Viewers Choice Award for Best Actress in a Drama n'afọ 2016. [15][16] Ihe nkiri ndị ọzọ ama ama ọ pụtara na ya gụnyere A Soldier's Story (2015), Out of Luck (2015), [17] na Couple of Days (2016). [18] Etomi zara Shiela n'agba nke anọ na nke ise nke Shuga, ihe nkiri onyonyo banyere mgbochi HIV / AIDS . [19][20] Etomi malitere ị bụ Amaka Obiora, onye uwe ojii nzuzo, n'ihe emume onyonyo Yemisi Wada a kpọrọ LasGidi Cops, nke pụtara na June n'afọ 2016 na televishọn. [21] E gosiputara ya na ndepụta nke Vogue's list of 14 global superstars. [22]
Etomi kwetere ị lụ Banky W n'ọnwa Febụwarị n'afọ 2017. [23][24] Di na nwunye ahụ lụrụ di na nwunye ọdịnala n'ụbọchị nke 19 n'ọnwa Nọvemba, agbamakwụkwọ ụlọ ikpe ha bụ n'ụbọchị nke 20 n'ọnwa Nọvemba, nakwa agbamakwụkwọ ndị ọcha n'ụbọchị nke 25 n'ọnwa Nọvemba n'afọ 2017; nke e mere na Cape Town, na South Africa . [25]