Adunni, onye amụrụ Queens, New York, United States [3] ka a German Irish nne na a Yoruba Nigerian nna. [4] A zụlitere ya na Lagos na United States. Ọ gara ụlọ akwụkwọ elementrị ya na Lagos n' Ogun steeti. Nna ya bi na Lagos, bụrụkwa onye ọchụnta ego na-eme nke ọma kpaliri ya ịmụ Accounting. O nwetara nzere na 'accounting' na Mahadum Kentucky na 2008. [5]
Adunni rụrụ ọrụ na ngalaba ụlọ na mkpuchi na United States tupu ọ gbanwee gawa na ngalaba ọrụ ntụrụndụ. Ọ gbalịrị ịmalite ịme ihe ejiji ma gosipụta ya na America's Next Top Model . Ka ọ laghachisịrị Naịjirịa, o nwetara ọrụ Nollywood mbụ ya mgbe ọ rụrụ ihe nkiri n'asụsụ Yoruba "You or I" na 2013. O gosiputala otutu ihe nkiri Nollywood nke asusu bekee na nke Yoruba, tinyere ihe nkiri nke egwu Sound Sultan na Ice Prince . [6][7] O nwetere nturu ugo Stella site na Institute of Journalism nke Naijiria maka mbọ ya n’ikwalite omenaala Naijirịa [8] Na 2017, ọ ghọrọ onye nnọchi anya aha maka OUD Majestic. [9]
It's Her Day (2016) mere ka AMVCA họpụta ya na 2017 dika onye na-eme ihe nkiri kacha enye nkwado n'Afrịka, . O nwetakwara onyinye dika onye na-eme ihe nkiri kacha enye nkwado na Lagos Film Festival maka ihe nkiri ahụ.