ụdịekere | nwanyị |
---|---|
mba o sị | Mozambique |
aha enyere | Alcinda |
aha ezinụlọ ya | Abreu |
ụbọchị ọmụmụ ya | 13 Ọktoba 1953 |
Ebe ọmụmụ | Buzi District |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Ndau, Portuguese, Bekee, French language |
ọrụ ọ na-arụ | Onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị |
ebe agụmakwụkwọ | University College London, Eduardo Mondlane University, Maputo University, University of the Witwatersrand, Eduardo Mondlane University |
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị | FRELIMO |
okpukpere chi/echiche ụwa | Catholicism |
Onye òtù nke | Organization of Mozambican Women |
Ihe nrite | National Order of Merit |
Alcinda António de Abreu (amụrụ n'afọ 1953) bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Mozambik. Ọ bụ Minista na-ahụ maka ihe gbasara mba ofesi nke Mozambique site n'afọ 2005 ruo n'afọ 2008, ebe ọ bụbu Minista na na-ahụ Maka ọdịmma ọha na eze. N'oge na-adịghị anya, ọ rụrụ ọrụ dị ka Minista na-ahụ maka gburugburu ebe obibi. Ọ na-arụ ọrụ iji mụba ọrụ ụmụ nwanyị na mgbanwe ihu igwe.
A mụrụ Alcinda António de Abreu na afọ 1953 na Mozambique.[1] Ọ na-arụsi ọrụ ike na Mozambique Youth Association ma jee ozi dị ka osote odeakwụkwọ ukwu ya na ngwụcha afọ 1970 na mmalite afọ 1980. Abreu bụ Minista nke Ọdịmma Ọha site na afo 1994 ruo n'afọ 1997. FRELIMO họpụtara Abreu dị ka onye otu National Elections Commissions (CNEs) nke na-ahụ maka ịhazi ntuli aka ime obodo nke afọ 1998 na ntuli aka afọ 1999 . Na nnọkọ FRELIMO nke afọ 2002, a họpụtara ya na Kọmitii ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke mmadụ iri na ise.[2]
Onye isi ala Armando Guebuza họpụtara ya dị ka Minista na-ahụ maka ihe gbasara mba ọzọ na Febụwarị 3, na afọ 2005, mgbe Guebuza kpọrọ gọọmentị ọhụrụ ya obere oge ka ọ banyere n'ọkwa.[3] Ka e mesịrị n'afọ ahụ, ọ gara leta José Manuel Barroso, Onye isi oche nke European Commission.[4]
Mgbe a gbanwere ọchịchị na Machị 10, na afọ 2008, e weghachiri ya n'ọkwa Minista nke Gburugburu Ebe Obibi; a ṅụrụ ya iyi n'ime ụbọchị 17 ka e mesịrị na ọnwa Machị 27.[5][6][5] O nyere iwu atụmatụ mba maka mmetụta mgbanwe ihu igwe na ụmụ nwanyị nọ na Mozambique, oge mbụ e chepụtara atụmatụ dị otú ahụ n'ebe ọ bụla n'ụwa.[7] Ọ kọwara na ọ dị mkpa ka ọha mmadụ gbanwee atụmatụ ha iji kwe ka ụmụ nwanyị nọ n'ime ime obodo tinye aka na ọrụ mgbanwe ihu igwe, n'ihi mmetụta nke a nwere na ọrụ ugbo.[8]