Alyce Clarke | |
---|---|
[[ Ambassador to Templeeti:CountryPrefixThe]] | |
Member of the Mississippi House of Representatives from the 69th district | |
In office Templeeti:En dash range | |
Succeeded by | Tamarra Butler-Washington |
Personal details | |
Born | Yazoo City, Mississippi, U.S. | 3 Julaị 1939
Political party | Democratic |
Alyce Griffin Clarke (amụrụ na ubochi nke ato n’onwa Julai, n’afo otu puku nari itolu na iri ato na itolu) bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị America. Onye ndọrọndọrọ ọchịchị, ọ bụbu onye otu ụlọ ndị nnọchi anya Mississippi site na mpaghara nke iri isii na itoolu, a họpụtara ya n’afo otu puku nari itolu na iri asato na ano ma jee ozi ruo afo puku abuo na iri abuo na ano. Ọ bụ nwanyị ojii mbụ a họpụtara na Ndị omeiwu Mississippi.[1]
A mụrụ Clarke n’ubochi nke ato n’onwa Julai n’afo otu puku nari itolu na iri ato na itolu, na Yazoo City, Mississippi. O nwetara nzere bachelọ na Mahadum Alcorn State na nzere masta na Tuskegee Institute. Ọ gakwara Mahadum Jackson State na Mahadum Mississippi . [2] Tupu ọ gbaa ọsọ maka ọfịs, Clarke rụrụ ọrụ na agụmakwụkwọ, na-akụzi akụ na ụba ụlọ. Ọ rụkwara ọrụ dị ka onye na-ahụ maka nri na-edozi ahụ n'ụlọ ọgwụ obodo dị na Hinds County . [3] Ọ lụrụ L.W. Clarke Jr ma ha nwere otu nwa, Demarquis Johntrell . [1][2]
A họpụtara Clarke na mbụ na House of Representatives nke Mississippi maka distrikti nke iri isii na itolu n’afo otu puku nari itolu na iri asato na ano. Ọ bụ nwanyị ojii mbụ a họpụtara na Ndị omeiwu Mississippi.[1] Ọ rụrụ ọrụ n'iweta mmemme nri ụmụ nwanyị, ụmụ ọhụrụ na ụmụaka na steeti ahụ, guzobe ụlọ ikpe ọgwụ ọjọọ na ịhazi nri ụtụtụ ụlọ akwụkwọ.[3] N'afọ ndị otu puku nari itolu na iri itolu, o guzobere obere oge "biracial, bipartisan" Women's Caucus na Mississippi House.[2][3]
Ọ lara ezumike nká na Ntuli aka nke afo puku abuo na iri abuo na ato na Mississippi na Nọvemba.[4]
N'afọ otu puku nari itolu na iri asato na otu, a chọpụtara na ọ na-arịa ọrịa multiple sclerosis.[3]
N'afọ puku abuo na iri abuo na ano, ọ ghọrọ nwanyị mbụ na onye isi ojii mbụ gosipụtara onyinyo ha na Mississippi State Capitol. Ihe osise ya bụ ihe osise mmanụ, ọ dịkwa n'ime ụlọ nke Capitol ebe Kọmitii Mmụta Ụlọ na-ezukọ.[5]
<ref>
tag; name "auto" defined multiple times with different content