ụdịekere | nwanyị ![]() |
---|---|
mba o sị | Naijiria ![]() |
aha n'asụsụ obodo | Amarachi Uyanne, ![]() |
Aha ọmụmụ | Amarachi Uyanne ![]() |
aha enyere | Amarachi ![]() |
ụbọchị ọmụmụ ya | 17 Julaị 2004 ![]() |
Ebe ọmụmụ | Ȯra Delta ![]() |
Asụsụ obodo | Asụ̀sụ̀ Ìgbò ![]() |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | English, Asụ̀sụ̀ Ìgbò, pidgin Naịjirịa ![]() |
ọrụ ọ na-arụ | onye na-abụ abụ, Ọgba egwu ![]() |
ebe agụmakwụkwọ | University Preparatory Secondary School ![]() |
oge ọrụ ya (mmalite) | 2012 ![]() |
okpukpere chi/echiche ụwa | Efefe Kraịst ![]() |
Ụcha ime anya | brown ![]() |
ụcha ntụtụ isi | Ntụtụ ojii ![]() |
ngwa egwu | olu egwụ, violin ![]() |
ụdị | African popular music, egwu hip hop ![]() |
webụsaịtị | http://www.amarachiuyanne.com/ ![]() |
nnọchiaha nkeonwe | L484 ![]() |
Amarachi Uyanne (ọnye amụrụ na mkpụrụ ụbọchị iri na asaa n' ọnwa asaa n' arọ 2004 nke eji Amarachi wee mara bụ nwada onye Nigerian na-agụ egwú, na-ete egwu ma na-akpọ ụbo oyibo. A maara ya nke ọma maka ịde mbiputa mbụ nke Nigeria Got Talent . [1] [2]
Amarachi bụ onye Delta State . O tolitere na Edo Steeti, ebe ọ bidoro ịgba egwu mgbe ọ dị afọ 5. [3] Na 2012, o ritere ihe nrite ego nke N10,000,000 mgbe ekwuputara ya dị ka onye mmeri nke mbipụta mbụ nke Nigeria Got Talent . E mechara kpọọ ya "odị na wata guba nde ego na Nigeria ". [4] Ọ gara University Preparatory Secondary School na Benin City, Edo State . Onye a ma ama na-eto eto gụsịrị akwụkwọ na kọleji na July 2019 ma bụrụ nwata akwukwo na Benson Idahosa University , Benin City, Edo State, Nigeria.
Mgbe Amarachi mechara pụta dịka onye mmeri nke Nigeria Got Talent, Amarachi wepụtara egwu izizi ya nke akpọrọ "Amarachi Dance". [5] Ọ gara n’ihu gosi Phyno n’abụ akpọrọ “Ova Sabi”; egwu na abo izizi otiri bu nke ndị mmadu huru na anya ma na etikwa ya na redio. [6] Ọ bu ọnye is Amarachi Talent Academy bu ụlọ akwụkwọ obidoro maka ịzụlite na ịzụ ụmụntakịrị nwere nkà igu egwu ma obu ịte egwu. [7]
Afọ | Emume onyinye | Nrite | Onye nnata / họpụtara ọrụ | Nsonaazụ | Ref |
---|---|---|---|---|---|
2014 | 9th Nigeria Music Video onyinye | Video kacha mma site na obere | "Ova Sabi" | Ahọpụtara | [8] |