ụdịekere | nwanyị ![]() |
---|---|
mba o sị | Naijiria ![]() |
aha enyere | Betty ![]() |
aha ezinụlọ ya | Abah ![]() |
ụbọchị ọmụmụ ya | 6 Maachị 1974 ![]() |
Ebe ọmụmụ | Otukpo ![]() |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | English, pidgin Naịjirịa ![]() |
ọrụ ọ na-arụ | onye ntaakụkọ, author, children's rights activist ![]() |
ebe agụmakwụkwọ | University of Lagos, University of Calabar ![]() |
ogo mmụta | nzere masters ![]() |
isi agụmakwụkwọ | English studies, English literature ![]() |
Ebe obibi | Lagos ![]() |
Ebe ọrụ | CEE HOPE ![]() |
Ihe nrite | Nigeria Media Merit Award ![]() |
"Betty Abah' Audio amụrụ n' 6 ọnwa Machị n'afọ 1974 bụ onye ọchụ ntà akụkọ nakwa ode akwụkwọ na Nijirịa. Ọ bụkwa ọnụ na-ekwuchitere maọbụ a gbaara ụmụ nwaanyị na ụmụaka ọgụ. O guzobere, ma bụrụkwa onye nchịkwata otu CEE HOPE. Otu a bụ otu na-agbachitere ụmụaka ụmụ nwanyị hụ na ha nwetere oke ruru ha. E guzobere otu a na Lagos Steeti .
A mụrụ Betty n' Otukpo,|Benue Steti, nke di na Middle Belt mpaghara nke Nigeria. O nwetara digiri nke mbụ ka ọ gụchara maka asụsụ bekee na ihe gbasara ebe ọba akwụkwọ na University of Calabar ma nwetakwa nzere Mastas n'agụmagụ ederede nke bekee na University of Lagos.
Betty rụrụ ọrụ mbụ n'ụlọ ọrụ akwụkwọ akụkụ a kpọrọ The Voice Newspaper di na Makurdi, Benue Steeti, ọ rụkwara n'ụlọ akwụkwọ akụkọ ọzọ a kpọrọ Newswatch na Tell Magazine, tupu ọ ga rụọ na Rocky Mountain News dịka onye otu Alfred Friendly Press Fellowships. [1] Dịka onye ọchụ nta akụkọ, ọ mụrụ ọrụ ịchụ nta akụkọ n'ụlọ ọrụ ndia The Voice Newspaper, Newswatch, Tell Magazine nakwa Rocky Mountain News na Denver, Colorado, U.S.A. Ọ dere akwụkwọ a kpọrọ Sound of Broken Chains, Go Tell our King Mother of Multitutes. [2] [3] Betty na ndị otu akpọrọ 'Environmental Rights Action; Friends of the Earth Nigeria' tupu o bido ụlọ ọrụ nke ya bụ CEE-HOPE n'ọnwa Disemba n'afọ 2013.
Abah etinyela aka n'ọtụtụ ikpe gbasara ndị a na-akpagbu maọbụ emegide iji napụta ha n'ọnọdụ a. ụfọdụ ikpe ndị a gụnyere ịnapụta ndị Chibok girls abducted ndị ọtu ọmekome akpọrọ Boko Haram,mgbago ugwu nke Nigeria, nkwado ụmụnwaanyị Niger Delta maka ichedo gburugburu ha,ịzọpụta ụmụ nwaanyi atọ ndi otu nje nke Ejigbo di na Lagos mekpara ahụ, ikpe gbasara kidnapping of Ese Oruru na ọtụtụ ndị ọzọ [3]
Afọ | Klaasị | Katigori | Otu na-enye onyinye |
---|---|---|---|
2001 | State Honours | Community sevice | National Youth Service Corps Nigeria |
2003 | Reporter of the year | Journalism | National Media Merit Awards Nigeria |
2006 | Fellow | internships | Alfred Friendly Press Fellowships, USA |
2006 | Fellow | Journalism | The Knight Journalism Press Fellowship,USA |
2006 | Fellow | Journalism | The Kaiser Family HIV/AIDS Fellowship,USA. |
2008 | Child-Friendly Reporter of the Year | Journalism | Media Excellence |
2010 | Participation | Leadership Program | Global Tobacco Leadership Program |
2012 | Honorary Mention | Poetry Prize | Assiociation of Nigerian Authors |
2014 | Honorary Metion | Journalism | Wole Soyinka Award for Investigative Reporting |