mba/obodo | Naijiria |
---|---|
dị na ngalaba nhazi mpaghara | Ȯra Niger |
dị na mpaghara oge | UTC+01:00 |
nhazi ọnọdụ | 9°5′0″N 6°1′0″E |
Bida bụ ógbè ọchịchị ime Obodo dị na Naịja Steeti, Naịjirịa na obodo dị n'okporo ụzọ awara awara A124 nke jigidere ọtụtụ ebe n'ógbè ahụ.
Ọchịchị imé Obodo a nwere 51 km2 (20 sq )ya na ọnụ ọgụgụ dị Puku narị asatọ na iri asatọ na asatọ,otu narị na irí asatọ na otu na ngụkọ nke afọ 2006.
Koodu ozi nke mpaghara ahụ bụ narị iteghete na iri na abụọ.[1]
Bida bụ obodo nke abụọ kachasị ukwuu na steeti Naịja nke nwere ọnụ ọgụgụ ndị bi na ya dị ọnụ ọgụgụ ruru puku narị irí asaa na asatọ, narị asatọ na iri anọ n'afọ(2007).[2] Ọ dị na ndịda ọdịda anyanwụ nke Minna, isi obodo nke Naíja Steeti, ọ bụkwa obodo akọrọ na nke kpọrọ nkụ.[3]
Mpaghara gụnyere Katcha, Enagi, Baddeggi, Agaie, Pategi, Lemu, Kutigi, na ndị ọzọ.[3]
E nwere ebe ndị ọzọ na Bida dị ka; ala Bamisu, Ramatu dangana, okporo ụzọ ECWA poly, obere ahịa, Main Market na Federal Medical Centre (Bida) na ndị ọzọ. E nwekwara ụlọ akwụkwọ dị iche iche dị ka Federal Government Girls College Bida, Federal Polytechnic Staff Secondary School, Government College Bida na ndị ọzọ.[4]
A maara obodo a maka mmepụta nka ọdịnala, ọkachasị iko, nka ọla na ngwa ọla. A makwaara Bida maka mmemme Durbar ya na emume ụbọchị Nupe . Ọ bụkwa ụlọ nke Federal Polytechnic, Bida, Federal Medical Center na ụlọ akwụkwọ ndị nọọsụ nke Naịja Steeti.[5]
Ndị isi agbụrụ bụ ndị Nupe. Bida bụ isi ụlọ ọrụ nke Alaeze Nupe nke Etsu Nupe (nke bụ Etsu Yahaya Abubakar ugbu a) duziri. Ụdị idu ndú nke obodo ochie nke Bida bụ emirship, a na-akpọkwa onye isi obodo ahụ Etsu Nupe. Agbụrụ ndị ọzọ gụnyere Igbo, Yoruba, Hausa, Igala na Gbagi, Ibira.[6][7]