ụdịekere | nwanyị ![]() |
---|---|
mba o sị | Naijiria ![]() |
aha n'asụsụ obodo | Biola Alabi ![]() |
Aha ọmụmụ | Biola Alabi ![]() |
aha enyere | Biola ![]() |
aha ezinụlọ ya | Alabi ![]() |
Ebe ọmụmụ | Njikota Obodo Amerika ![]() |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Bekee ![]() |
ọrụ ọ na-arụ | onye ọchụnta ego ![]() |
ụdị ọrụ ya | onye na-emeputa ihe nkiiri ![]() |
ogo mmụta | Bachelor of Science ![]() |
isi agụmakwụkwọ | Ahụike ọhanaeze ![]() |
Ebe ọrụ | Lagos ![]() |
affiliation string | Biola Alabi Media Consulting ![]() |
Ụcha ime anya | brown ![]() |
ụcha ntụtụ isi | Ntụtụ ojii ![]() |
so na | World Economic Forum Annual Meeting 2015 ![]() |
Onye òtù nke | Unilever ![]() |
nnọchiaha nkeonwe | L484 ![]() |
Biola Alabi Audio bụ nwaafọ Nigerian ji ego achụ egọ. O so onye otu ya wube ụlọ ọrụ a kpọrọ Biola Alabi Media (BAM), [1] Ụlọ ọrụ a na-emepụta ihe nkiri nakwa fim di iche iche ka ndi Nigeria zụrụ , ụfọdụ ihe nkiri ndi a metụtara ụdị nri di iche iche ana esi ebe di iche iche n'obodo Nigeria bụ nke ọ kpọrọ 'Food Travel series Buka and Joint'. Ọ na-egosi ihe nkiri Fim akpọrọ Lara and the Beat. [2] [3] Ọ rụburụ ọrụ dị ka nnukwu Daịrektọ n'ụlọ ọrụ M-Net nke Afrika. [4]
Nne na Nna Biola bụ ndị Nigeria mụrụ Biola na mba America. Biola bụ nwa nke izizi n'afọnne ya, Nna ya bu onye Akure dị na Ondo State, ebe Nne ya si Ilesa otu n'ime obodo di na Osun State. Biola na Ezinaụlọ ya laghachitere na Nigeria. [4] Alabi mechara gaa University of Cincinnati ebe ọ gụrụ maka mgbochị ọria nakwa nchekwa ahụike ọhanaeze. [5] Ọ gara n'ihu ịgụ na Mahadum nke Havard Kennedy School of Government ya na Mahadum nke Yale Jackson Institute of Global Affairs. [6]
Alabi bidorp otu ọ kpọrọ 'Grooming for Greatness' Otu a bụ iji kuziere ndi na-eto eto uzọ dị iche ha ga esi bụ ezigbo onye ndu nke Africa. O ji ọkwa dika Daịrektọ na-achikwata ihe n;ụlọ ọrụ nke M-NET Africa ngalab nke otu Naspers. Tupu ọ nọdụ n'ọkwa a, mgbe ọ nọ mba America o so n'otu ndi isi haziri ihe nkiri ụmụaka wuru ewu akpọrọ a Sesame Street, ọ bụkwa otu ndi otu azumahia ụgbọala ndi Korea . Aha ụgbọala bụ Daewoo nke di na USA. [5]
N'afọ 2018, Alabi so wee malite ngosipụta ọrụ aka nka akpọrọ Remember To Rise . [7]