ụdịekere | nwanyị |
---|---|
mba o sị | Naijiria |
aha n'asụsụ obodo | Bisi Silva |
Aha ọmụmụ | Olabisi Obafunke Silva |
aha enyere | Olabisi, Q106368328 |
aha ezinụlọ ya | Silva |
ụbọchị ọmụmụ ya | 29 Mee 1962 |
Ụbọchị ọnwụ ya | 12 Febụwarị 2019 |
Ebe ọ nwụrụ | Lagos |
ihe kpatara ọnwụ | Kansa ara |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Bekee, pidgin Naịjirịa |
ọrụ ọ na-arụ | archivist, exhibition curator, art critic |
ụdị ọrụ ya | exhibition curation, art criticism, ǹkà |
onye hiwere | Centre for Contemporary Art |
nnọchiaha nkeonwe | L484 |
Bisi Silva ( Olabisi Obafunke Silva ) (29 Mee 1962 - 12 Febụwarị 2019) [1] bụbu onye nlekọta nka nke ala Naijiria bibu na Legos .
Bisi Silva gụrụ akwụkwọ nzere mast na Visual Arts Administration: Curating and Commissionering Contemporary Art na Royal College of Art,dị na Lọndọn, n'afọ 1996. Na mbido ụbọchị nke ọrụ ya, Silva rụrụ ọrụ dị ka onye nlekọta nka nke onwe ya ma guzobe Fourth Dial Art, ụlọ ọrụ na-achọghị uru na Lọndọn nke a raara nye ịkwalite na ịzụlite omume ọdịnala na nka anya, yana iji nyere ndị na-ese ihe aka ị mekọrịta mmekọrịta bara uru n'ụlọ ọrụ nka na ndị ọkachamara. Otu n'ime ihe ndị pụtra na nhiwe nke Fourth Dial Art bụ ihe ngosi njem, Ndị isi ala, nke gosipụtara ọrụ nke Faisal Abdu'Allah, onye bụ onye na-ese ihe nkiri pụtara mgbe ahụ ụwa ise ihe nke Lọndọn.
Ọ gara Legọs,na Nigeria n'afọ 1999 na ebumnuche nke ị malite ọrụ ebe ahụ. [2] Silva bụ onye guzobere na onye ntụzi aka nka nke Center for Contemporary Art, Lagos (CCA, Lagos), nke mepere n'ọnwa Disemba n'afọ 2007. CCA Lagos na-akwalite nnyocha, ndetu na ngosipụta metụtara nka n'Afrịka na mba ofesi. Na CCA, Lagos, Silva lekọtra ọtụtụ ihe ngosi, gụnyere nke ya na onye eserese Naịjirịa bụ Ndidi Dike . Silva bụkwa onye guzobere Asiko Art School, nke na-akọwa onwe ya dị ka "part art workshop, part residency, and part art academy" [3]
Ọ bụ onye na-ahụ maka The Progress of Love, mmekọrịta dị n'etiti mpaghara atọ n'Amerịka na Naijiria (Ọktoba 2012) - Jenụwarị 2013). Silva bụ onye na-elekọta JD 'Okhai Ojeikere : Moments of Beauty, Kiasma, Helsinki (Eprel - Nọvemba 2011). Ọ bụkwa onye rụkọrọ ọrụ nlekota ọnụ maka nke agba nke abụọ nke Thessaloniki Biennale of Contemporary Art, Greece, Praxis: Art in Times of Uncertainty n'ọnwa Septemba n'afọ 2009. N'afọ 2006, Silva bụ otu n'ime ndị na-elekọta Dakar Biennale na Senegal. Na mmekorita ya na onye nnyyocha si Portugal bụ Isabel Carlos, ọ họpụtara ndị na-ese ihe maka ihe nrite Artes Mundi agba nke atọ na Wales . O lekọtara Contact Zone: Contemporary Art from West and North Africa (Ọktoba 2007) na ihe ngosi akpọrọ Telling ... Contemporary Finnish photography, in the Seventh Biennial of African Photography na Bamako (Nọvemba 2007).
Silva dere na nka dị ugbua maka mbipụta mba ụwa, gụnyere Art Monthly, Untitled, Third Text, M Metropolis, Agufon na maka akwụkwọ akụkọ Naịjirịa dịka This Day . Ọ nọ na ngalaba nchịkọta akụkọ nke n.paradoxa, akwụkwọ akụkọ gbasara ndị nwanyị na mba ụwa, ọ bụkwa onye nchịkọta akụkọ ọbịa maka okwu Afrịka na ndị Afrịka mba ụwa nke n.paradoxa (Jenụwarị 2013).
Silva nwụrụ na Legos,dị na Naijiria, mgbe ọ dị afọ iri ise na isii ka ya na ọrịa kansa ara lụrụ ọgụ afọ anọ.
Ndị na-ahụ maka ọrụ Nina Zimmer na Touria El Glaoui kpọrọ aha Silva n'etiti ndị na-elekọta nka kachasị metụta ndụ ndị mmadụ n'afọ iri. [4]