ụdịekere | nwanyị ![]() |
---|---|
mba o sị | Naijiria ![]() |
ụbọchị ọmụmụ ya | 28 Jenụwarị 1933 ![]() |
Ebe ọmụmụ | Ilesa ![]() |
Asụsụ obodo | Asụsụ Yoruba ![]() |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | English, Asụsụ Yoruba ![]() |
ọrụ ọ na-arụ | university teacher, historian ![]() |
ebe agụmakwụkwọ | Stephen Perse Foundation, University of St Andrews, University of Oxford ![]() |
Ebe obibi | Ibadan ![]() |
agbụrụ | Ndi Yoruba ![]() |
nnọchiaha nkeonwe | L484 ![]() |
Bolanle Awe ( Yoruba : Bọ́láńlé (Fájẹ́m̄bọ́là) Awẹ́ bụ onye a mụrụ na mkpụrụ ụbọchị iri na asatọ n' ọnwa mbụ (Jenụarị) n' arọ 1933. Ọ bụ ọkammụta akụkọ ihe mere eme nke Naijiria na Yoruba .
A mụrụ Awe na Jenụwarị 28, 1933 na obodo Ilesa, Nigeria nye Samuel Akindeji Fajembola na Mosebolatan Abede. Nna ya bụ onye Ibadan, bụrụkwa onye na-azụ ahịa koko na onye nlekọta na John Holt & Co., ụlọ ọrụ mbupu na azụmaahịa dị iche iche. Nne ya si n'obodo Ilesa, ma bụrụ onye ezi na ụlọ Abede, ngalaba nke Ụlọ Eze ndị Bilayirere, otu n'ime ụlọ eze 4 nke Ilesa. Nne ya bụ onye nkụzi. Mgbe ebufere nna ya n'otu alaka ụlọ ọrụ John Holt & Co. dị na Ilesa ka a mụrụ Awe. Ọ kọwara na ndụ ya n'Ilesa bụ nke juru afọ n'ihi ịdị n'otu nke dị n'etiti ndị okpukpe Alakuba, Ụka Kraịst, na ndị Yoruba. [1] [2] Ọ gara ụlọ akwụkwọ na Holy Trinity, Omofe- Ilesha, tupu ya na ezinụlọ ya kwaga Ibadan mgbe ọ dị afọ 8, ebe ọ gara akwụkwọ na St James Primary School, Okebola, Ibadan na St Anne's School, Ibadan . [3] Ọ lere ule agba nke A na Ụlq akwụkwọ Perse dị na Cambridge. Ọ gara Mahadum St Andrews dị na Scotland ebe ọ nwetara nzere masters na akụkọ ihe mere eme, tupu ọ nweta nzere doctorate n'akụkọ ihe mere eme na Mahadum Oxford . Awe laghachiri Naijiria, ebe ọ ghọrọ onye nkuzi na mahadum Ibadan .
Ọ bụzi prọfesọ mahadum Ibadan. Ọ bụ otu n'ime ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme nke kwere ka ihe ha na-achọ rue n'asụsụ ọnụ . Nke a pụtara na ọ na-enwe ike ị nwetaghachi akụkọ ihe mere eme tupu ọbịbịa nke ndị Europe. Ọ chọpụtakwara na mbọ nwaanyị n'akụkọ ihe mere eme bụ nke a na-eleghara anya. Ọ bụ ya mere o jiri nye aka n'iguzobe otu Women's Research and Documentation Centre (WORDOC) iji kwalite nhazi nchọcha ụmụ nwaanyị na na usoro ọhụrụ iji mụọ ụmụnwaanyị Naijiria. [4] N'afọ 1982, e mere ya ka ọ bụrụ Officer of the Order of the Federal Republic of Nigeria. [5]
N'ụbọchị Krismas, 1960, ọ lụrụ Olumuyiwa Awe. Ọ ga-abụkwa prọfesọ ma mụọ ụmụ. Di ya nwụrụ na 2015 mgbe ọ dị afọ 82.
Site na 1990 ruo 1992 ọ jere ozi dịka onye isi oche mbụ nke National Commission for Women (NCW). Otú ọ dị, ọ gbara arụkwaghịm n'ọkwa ahụ n'afọ 1992 ka gọọmenti mezigharịrị Kọkwa ahụ ma tinye ya n'okpuru nlekọta nke First Lady of Nigeria, Maryam Babangida . [6]
Na 1998, ọ lara ezumike nká [5] na n'afọ sochirinụ, ngalaba nke ọmụmụ Afịrịka bipụtara obere akwụkwọ gbasara ya. [7] Mgbe ọ lara ezumike nká, ọ gara n'ihu na-eme nchọpụta nke mere ka ọ ghọọ Pro-Chancellor nke University of Nigeria na Nsukka na 2005. [5]