ụdịekere | nwanyị |
---|---|
mba o sị | Naijiria |
aha n'asụsụ obodo | Bolanle |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Bekee, pidgin Naịjirịa |
ọrụ ọ na-arụ | oko akuko ihe onyonyo |
ụdị ọrụ ya | okoo akuko, onye na-emeputa ihe onyoyo |
ebe agụmakwụkwọ | Loyola University Chicago, Rosslyn Academy, Wichita Southeast High School |
ogo mmụta | Bachelor of Arts |
ihe omume dị ịrịba ama | Project Fame West Africa 3 |
Bolanle Olukanni Audio bụ onye na-ekwupụta ihe omume na onyonyo, nke eji mara ya bụ ihe ngosi ya na Mo na-eme a kpọrọ 'Moment with Mo' na
DStv na Project Fame West Africa
Bolanle bu nwafor Nigeria, Israel, America nakwa Kenya. [1] Olukanni gụrụ praịmarị na St. Saviour dị na Lagos wee gaa gụọ Secọndịrị na Queens College . Olukanni gara Kenya ebe ọ nọ wee ga ụlọ akwụkwọ Rosslyn Academy nke di na Nairobi, Kenya maka ngụcha akwụkwọ nke Sekọndịrị, Tupu ọ gụcha klasị nke ikpeazụ na sekọndịrị, ọ gara mba Amerika ebe ọ nọrọ gụcha sekọndịrị ya [2] dị na [3], o bụ ebe a ka ọ nọ mee asọmpi nke National Speech and Debate Tournament maka nkọwapụta egwuregwu.
Bolanle so wee wube ụlọ ọrụ akpọrọ 'Sage and Walls' bụ nke na-emepụta ọtụtụ ihe gbasara mgbasa ozi nke onyonyo, redio,igwe ikuku nakwa ihe ndi ọzọ dị iche iche . ụlọ ọrụ a bidoro gosipụtawa ọtụtụ ihe di iche iche dika 'Ọn the carpet with Bolinto' bụ nke gbasra emume maọbụ mmeme ndi na-ewu ewu maọbụ ndị ama ama na mba Afrika. [4]
N’afọ 2007, Olukanni natara Bachelor's degree abụọ site na Loyola University, Chicago, Digiri ndị a gbasara nzikọrita ozi na ngụkọtita akwụkwọ nke mba dị iche iche a kpọrọ 'Communications International Studies. [5] Ọ sokwa Nwa ada Mo gosipụta ihe nkiri akpọrọ 'Moments with Mo' na DStv nakwa Project Fame West Africa . [1]
N'afọ 2019, o dere, hazie ma kwado ederede akụkọ mere eme nke izizi ya ọ kpọrọ 'Gods Wives' [4] ọ mechara bụrụ onye na-egosipụta ihe omume a kpọrọ 'The Juice na Ndani TiVi ".