ụdịekere | nwanyị |
---|---|
mba o sị | Naijiria |
ụbọchị ọmụmụ ya | 1991 |
Ebe ọmụmụ | Lagos |
Asụsụ obodo | Asụ̀sụ̀ Ìgbò |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Bekee, Asụ̀sụ̀ Ìgbò, pidgin Naịjirịa |
ọrụ ọ na-arụ | odee akwụkwọ |
ụdị ọrụ ya | creative and professional writing, prose |
ebe agụmakwụkwọ | University College London, King's College London |
Ọrụ ama ama | Sankofa, Welcome to Lagos |
Ihe nrite | Fellow of the Royal Society of Literature, Betty Trask Award |
Imachibundu Oluwadara Onuzo Audio FRSL (amuru ya na afọ 1991). Ọ bu onye ọdee akwụkwọ na Naịjirịa. Akwụkwọ mbụ ya bụ Nwa nwanyị Spider King, meriri onyinye Betty Trask, [1] ka edepụtara aha maka Dylan Thomas Prize [2] na ihe onyo Commonwealth Book Prize, [3] ma bụrụkwa ndị tegoro aka e wepụtara aha ha maka Desmond Elliott Prize [4] na Etisalat Nrite maka ọdee akwụkwọ. . [5]
A mụrụ Chibundu Onuzo na Naịjirịa na afọ otu puku 1, nke ọdụdụ n'ime ụmụaka anọ nne na nna bụ ndị dọkịta, tolitere na Lagos.[6][7] Ọ gakwara England mgbe ọ dị afọ ịrị na ano, ka ọ gaa gụọ akwụkwọ na ụlọ akwụkwọ ụmụ nwanyị niile na Winchester, Hampshire, maka GCSEs,[8] na mgbe ọ dị afọ ịrị na asaa ka ọ malitere ide akwụkwọ mbụ ya, nke Faber bịanyere aka na akwụkwọ na ya na afọ abụọ mgbe e mesịrị Faber bipụtara ya bụ akwụkwọ mgbe ọ dị afọ ịrị abụọ na ọtụ.[9][10] Ọ bụ ya bụ nwata nwanyị pekarichara mpe na ọrụ ọdee akwụkwọ nke na-ede akwụkwọ nke ndị na ebipụta akwụkwọ weghaara.[11] Na ntule akwụkwọ ya nke abụọ, Nnọọ na Lagos (afọ puku abụọ na iri na isii), Helon Habila dere na The Guardian : "Ngosipụta nke Onuzo banyere agwa mmadụ na-abụkarị nchekwube, echiche ya banyere ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ọha na eze na-enwe obi ebere; obodo Lagos, ikekwe agwa kacha mma na-adọrọ mmasị. " [12]
Onuzo nwetara akara ugo mmụta bachelor nke mbụ na akụkọ ihe mere eme na King's College London (afọ puku abụọ na iri na abụọ), [13] [5] ma gaa n'ihu inweta ugo mmụta masters na iwu ọha na eze na Mahadum College London . [14] N'ihe dị ka afọ puku abụọ na iri na asaa, ọ gụrụ akwụkwọ PhD na King's College London. [15]
Ọ bụ onye ntinye aka na akwụkwọ anthology New Daughters of 2019, nke Margaret Busby deziri. [16]
Nwa nwanyi Spider King meriri onyinye Betty Trask (afọ puku abụọ na iri na atọ), [17] ma na afo puku abụọ na iri na abụọ ka edeputara aha ndi Dylan Thomas Prize [18] na akwukwo ndi Commonwealth . [19] Nke ozo bu na achọrọ akwụkwọ ọhụrụ maka Desmond Elliott Prize [20] na onyinye Etisalat maka akwụkwọ na afọ puku abụọ na atọ. [21]
Na Eprel afọ puku abụọ na iri na ato ka ahoputara Onuzo maka akwụkwọ ndi Hay Festival nke Afrịka iri atọ na itenanị nke ndi ode akwukwo iri ato na ato nke di Sub-Saharan ndi erubeghị afo iri ano nwere ikike ha bu iji akowaputa odi n’iru n’ederede ala Africa. [22]
Na ọnwa Juun afọ puku abụọ na asatọ ka a họpụtara Onuzo ka ọ bụrụ onye otu ndị Royal Society of Literature na atụmatụ ya na “40 Under 40”. [23]
Na afọ puku abụọ na iri abụọ American Black Film Festival, HBO Short Film Asọmpi nke meriri bụ Dolapo Is Fine, nke Onuzo dekọtara ya na ya bụ nke sitere na obere akụkọ ya bụ "Sunita". [24] [25] Ihe nkiri ahụ, nke Joan Iyiola bu na-agụsikwa ike maka ndị bafta Britain dị mkpụmkpụ.[26]