ụdịekere | nwoke |
---|---|
mba o sị | Njikota Obodo Amerika, Naijiria |
obodo maka egwuregwu | Naijiria |
Aha enyere | Chidi |
aha ezinụlọ ya | Okezie |
ụbọchị ọmụmụ ya | 8 Ọgọọst 1993 |
Ebe ọmụmụ | Njikota Obodo Amerika |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Bekee, pidgin Naịjirịa |
ọrụ ọ na-arụ | asọmpi egwuregwu, sprinter |
Ebe obibi | Philadelphia |
Ụcha ime anya | agba aja aja |
ụcha ntụtụ isi | Ntụtụ ojii |
ụdị egwuregwu | egwuregwu |
ịdọ aka ná ntị egwuregwu asọmpi | 400 metres |
so na | 2018 Commonwealth Games, 2018 African Championships in Athletics – men's 400 metres |
Chidi Anthony Okezie (amụrụ na abalị asatọ n'ime ọnwa asatọ n'afọ otu puku, narị iteolu na iri iteolu n'atọ (August 8, 1993) bụ onye na-agba ọsọ na US nke sitere na Naijiria na Jamaica.[1] Okezie na-asọ mpi mba ụwa maka Naijiria. Ọ bụ onye nwetara ọla nchara ugboro abụọ na African Championships na mita 400.
Nna ya, Moses Okezie bụ onye Naijiria na nne ya Carol Morris bụ onye Jamaica. O nwere ụmụnne itoolu.[2] Ọ gụsịrị akwụkwọ na Mahadum Hampton na afọ puku abụọ na iri na ise (2015) ma nwee nna ukwu na egwuregwu nchịkwa (Masters in Sports Administration)
Okezie so na ndị otu American 4 × 400 m relay team nke meriri nrite ọla edo na afọ puku abụọ na iri na abụọ (2012) World Junior Championships in Athletics na Barcelona.[3]
Ọ nọchitere anya Naijiria na 2018 Commonwealth Games wee ruo ọkara ikpeazụ nke 400 m. Ọ gbakwara ụkwụ arịlịka maka mba ahụ n'ime ọkụ relay 4 x 400. Ndị otu ahụ gụchara nke abụọ mana emecha chụpụ ha maka mmebi nke ụzọ.[4]
2018 African Championships bụ ihe ịga nke ọma maka Okezie. O meriri ọla nchara n'otu n'otu na mita 400 n'azụ Baboloki Thebe na Thapelo Phora. Nke a mere ka ọ bụrụ onye nwetara ọla nchara ugboro abụọ na African Championships ebe ọ meriri ọla nchara na afọ puku abụọ na iri na isii (2016) Championships na Durban. O mechara mee ka ndị otu Naijiria 4 x 400 m relay nweta ọla nchara n'azụ Kenya na South Africa. Okezie bụkwa onye otu African quartet nke nọ n'ọnọdụ nke abụọ na ngwakọta 4 x 400 m relay na afọ puku abụọ na iri na asatọ (2018) IAAF Continental Cup.
N'afọ puku abụọ na iri na iteolu (2019), o ritere ọla nchara na 4 × 400 mita nke ụmụ nwoke na 2019 African Games nke e mere na Rabat, Morocco.[5] O nwetakwara ọla nchara na mita 400 nke ụmụ nwoke.[5]
Ihe kacha mma ya na mita 400 bụ 45.24 nke o setịpụrụ na afọ puku abụọ na iri na asatọ (2018) Culturama Games na Nevis.
Representing the Àtụ:USA | |||||
---|---|---|---|---|---|
2012 | World Junior Championships | Barcelona, Spain | 1st | 4 × 400 m relay | 3:03.99 |
Representing Àtụ:NGR | |||||
2016 | World Indoor Championships | Portland, United States | 15th (h) | 400 m | 47.05 |
5th | 4 × 400 m relay | 3:08.55 | |||
African Championships | Durban, South Africa | 3rd | 400 m | 45.76 | |
2018 | World Indoor Championships | Birmingham, United Kingdom | 17th (sf) | 400 m | 48.53 |
Commonwealth Games | Gold Coast, Australia | 21st (sf) | 400 m | 47.33 | |
– | 4 × 400 m relay | DQ | |||
African Championships | Asaba, Nigeria | 3rd | 400 m | 45.65 | |
3rd | 4 × 400 m relay | 3:04.88 | |||
2019 | African Games | Rabat, Morocco | 3rd | 400 m | 45.61 |
3rd | 4 × 400 m relay | 3:03.42 | |||
2022 | African Championships | Port Louis, Mauritius | 4th | 200 m | 21.02 |
3rd | 4 × 400 m relay | 3:07.05 |
N'èzí
N'ime ụlọ