ụdịekere | nwanyị |
---|---|
mba o sị | Njikota Obodo Amerika |
ụbọchị ọmụmụ ya | 1981 |
Ebe ọmụmụ | Port Harcourt |
ọrụ ọ na-arụ | ode akwukwo ifo |
onye were ọrụ | Southern New Hampshire University |
ebe agụmakwụkwọ | Pennsylvania State University, Rutgers University |
agbụrụ | Ndi Afrika nke Amerika |
Ọrụ ama ama | Under the Udala Trees |
Ihe nrite | Lambda Literary Award |
webụsaịtị | http://www.chinelookparanta.com/ |
nnọchiaha nkeonwe | L484 |
Chinelo Okparanta (a mụrụ n'afọ 1981) bu onye Naijiria-Amerika bụrụkwa onye ode akwukwo na ode akwụkwọ di nkenke . [1] A mụrụ ya na Port Harcourt, Nigeria, ebe a nọrọ zụlite ya [2] ruo mgbe ọ dị afọ iri, bụ mgbe ya na ezinụlọ ya kwagara United States . [3]
Chinelo Okparanta bụ onye a mụrụ na Port Harcourt, nke obodo Naijiria , ma mgbe ọ dị afọ iri, ya na ezinụlọ ya kwagara obodo Amerịka. Ọ gụrụ akwụkwọ n'ụlọ akwụkwọ Pennsylvania State University ( Schreyer Honors College ), Mahadum Rutgers ya na Iowa Writers' Workshop . [2]
Okparanta ebipụtala nkenke akụkọ mbipụta nke gụnyere Granta, [4] New Yorker, Tin House, The Kenyon Review, The Southern Review, TriQuarterly, Njikọ, Subtropics na The Coffin Factory . Edemede ya apụtala na blọgụ nke AGNI,
lọgụ ihe nriteya Akblọgụ nke ụkọ, na Mahadu, blọọgụ Mmemme Writing International . [5] Okparanta enweela mkpakọrịta ma ọ bụ nkuzidịkaaọkammụta nleta na Mahadum nke Iowa, Mahadum Colgate, Mahadum Purdue, College City College of New York, na Mahadum Columbia . [6] Ọ bụ ọkammụtarọfesasụsụnbekee ya na nke ide akụkọ ifo l ifo) na Mahadum Bucknell, ebe ọ otu onye n'ime ndị na-eme nyocha na ngalaba bụkwa C. Graydon & Mary E. Rmawbụrụkwa ọkammụta nke odee abụ na ode ihe okike nke yana Margaret Hollinsheaitinafọ g ruo 2021. Ugbu aosote ọkammụta nrịtasụsụ a nke bekee na onymgbazismemideeihe okike i'ụlọiakwụkwọ ng na Swarthmore College . [7]
Nchịkọta nkenke akụkọ so na akụkọ mpụta mbụ ya, Obi Ụtọ, Dị ka Mmiri (Granta Books na Houghton Miffin Harcourt ), bụ nke a gụnyere n'afọ 2013 maka Frank O'Connor International Short Story Award, [8] ọ ruru na agba nke ikpeazụ n'afọ 2014 maka ihe nrite New York Public Library Young Lions Award, [9] wee nweta 2014 Lambda Literary Award for Lesbian Fiction . [10] Ahọpụtala ya maka mkpakọrịta ndị nka na United States [11] ma bụrụ onye ruru na agba nke ikpeazụ na Rolex Mentor na Protegé Arts Initiative in Literature n'afọ 2014.[12] Ihe nkwanye ùgwù ndị ọzọ gụnyere ihe nrite Society of Midland Authors (maka onye ruru na agba nke ikpeazụ nke afọ 2013), [13] ihe nrite Caine Prize for African Writing (maka onye ruru na agba nke ikpeazụ nke afọ 2013), na ihe nrite ndị ọzọ. [14]
Nkenke akụkọ ya akpọrọ "Fairness" bụ nke a gụnyere na PEN/O. Henry Prize Akụkọ, n'etiti nkenke akụkọ iri abụọ dị elu nke afọ 2014. [15]
Obi Ụtọ, Dị ka Mmiri bụ ndị nchịkọta akụkọ họrọ maka Nyocha Akwụkwọ New York Times na Septemba 20, 2013. [16] Edepụtara mkpokọta ahụ dị ka otu n'ime akụkọ ifo nke Africa kacha mma nke The Guardian nke afọ 2013, [17] ekwuputara dị ka onye ruru na agba nke ikpeazụ maka ihe nrite Etisalat nke Naijiria maka akwụkwọ edemede n'ọnwa Disemba afọ 2014. [18] [19]
Akwụkwọ akụkọ mbụ ya, N'okpuru Osisi Udala, bụ nke ebipụtara na 2015. Onye nyocha New York Times kpọrọ Okparanta “onye ode akwụkwọ mara mma na nke ziri ezi”, [20] The Guardian (UK) kọwara akwụkwọ ahụ dị ka "akwụkwọ akụkọ na-adọrọ adọrọ banyere nwa agbọghọ nwere mmasị na ụmụ nwaanyị ibe ya tolitere na Naijiria n'oge agha obodo Nigeria ... " n'ime nkea ". . . Okparanta kọwara nke ọma etu a ga-esi nwee nhazi n'etiti akụkọ ịhụnanya na akụkọ agha." [21]
N'okpuru Osisi Udala bụ Nhọrọ Ndị nchịkọta akụkọ Nleba Akwụkwọ New York Times [22] yana nke ahọpụtara maka ihe nrite Kirkus Reviews gbasara ide akụkụ ifo nke afọ 2015. [23] Otu n'ime NPR 's "Akwụkwọ kacha mma afọ 2015", ọ bụkwa "akwụkwọ" kacha mma" nke Buzzfeed, The Wall Street Journal, The Millions, Bustle, Shelf Awareness, and Publishers Lunch [24] ma bụrụkwa nke "a kasị atụ anya" ndepụta, n'etiti ndị ọzọ. . Edepụtara ya ogologo oge maka ihe nrite Center for Fiction First Novel Prize, nke afọ 2015[25] họpụtara maka ihe nrite NAACP Image Award n'afọ 2016 maka akwụkwọ akụkọ ifo pụrụ iche , [26] a họpụtara ya maka ihe nrite Hurston-Wright Legacy Award n'afọ 2016 nke akụkọ ifo, [27] onye ruru na agba nke ikpeazụ maka ihe nrite ndị odee Bipụta Triangle ( Ferro-Grumley Award ), [28] ọkara ikpeazụ maka ihe nrite VCU Cabell First Novelist Award afọ 2016, [29] depụtara ogologo oge maka ihe nriteChautauqua Prize nke afọ 2016, wee nweta ihe nrite 2016 Lambda Literary Award na katigori akụkụ ifo gbasara ndị nwanyị na nwanyi . [30]
N'okpuru osisi Udala tụrụ ugo n'afọ 2016 maka ihe nrite na akụkọ ifo nke Jessie Redmon Fauset Award [31] ma bụrụ nhọrọ afọ 2017 maka Amelia Bloomer Project American Library Association . [32]
N'afọ 2017, Okparanta nwetara ihe nrite nturu ugo nrịbama Triangle nke 2016 Betty Berzon Emerging Writer . [33] N'okpuru osisi Udala bụ nke e depụtara maka International Dublin Literary Award nke afọ 2017. [34]
Pulse nke Naijiria kpọrọ akwụkwọ a bụ n'okpuru osisi Udala aha dịka otu n'ime akwụkwọ iri pụtara ìhè nke Naijiria maka afọ 2015. [35] YNaija depụtara ya dị ka otu n'ime akwụkwọ iri kachasị ama ama nke 2015. [36] Afridiaspora depụtara ya dị ka otu n'ime akwụkwọ akụkọ Afrịka kacha mma nke 2015. [37]
N'ọnwa nke anọ afọ 2017, Granta họpụtara Okparanta maka otu oge n'ime afọ iri Best of Young American Novelists list. [38] [39]
Edemede ya "Trump na klas" ka a gụnyere na anthology New Daughters of Africa, nke Margaret Busby deziri n'afọ 2019. [40]