ụdịekere | nwanyị |
---|---|
mba o sị | Naijiria |
aha enyere | Chioma |
ụbọchị ọmụmụ ya | 28 Jenụwarị 1999 |
Ebe ọmụmụ | Naijiria |
Asụsụ obodo | Asụ̀sụ̀ Ìgbò |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Bekee, Asụ̀sụ̀ Ìgbò, pidgin Naịjirịa |
ọrụ ọ na-arụ | Onye otu egwuregwu bọọlụ |
ọnọdụ egwu na otu / ọpụrụiche | gaa n'ihu |
onye nsonye òtù egwuregwu | Rivers Angels F.C., Confluence Queens F.C., FC Minsk, Yanga Princess |
ụdị egwuregwu | footbọl |
Success Chioma Wogu Audio (a mụrụ n'ụbọchị nke 28 n'ọnwa Jenụwarị n'afọ 1999) bụ nwafọ Naijiria na=agbara ndị FC Minsk bọọlụ na Belarusian Premier League . Ọ na-apụtakwa maka egwuregwu Nigeria women's national football team na Naijiria. Ọ pụtra mdụ ị gba bọọlụ na Africa Women Cup of Nations mgbe ọ dị afọ 17. [1]
Wogu bụ onye kachasị nye goolu (goolu isii) n'otu Confluence Queens na asọmpi 2014 Nigeria Women Premier League, bụ nke mbụ ya ị pụta n'asọmpi ahụ. [2] N’egwuregwu 2017 Nigeria Women Premier League n’etiti Rivers Angels na Heartland Queens, Wogu nyere goolu mere ka ndị Rivers Angels jidesie ọkwa a ike. [3] Mgbe o gosipụtara ọmarịcha egwuregwu n'ụlọ, Wogu tufuru ohere nke butere ngwụcha mmeri egwuregwu iri nke ndị Rivers Angels. [4]
Agbanyeghị na o so na egwuregwu maka Naịjirịa ị banye n'asọmpi 2014 African Women's Championship, onye isi nchịkwa, Edwin Okon wepụrụ Wogu n'akwụkwọ aha nke ikpeazụ. Agbanyeghị, n'agba nke afọ 2016, o so ndị otu egwuregwu, na-enye aka site na benchi na egwuregwu mbụ ya na Mali.