Ụlọ ọrụ mmepụta ihe | ụlọ ọrụ ihe nkiri, Ihe nkiri nke Naịjirịa, ụlọ ọrụ ntụrụndụ ![]() |
---|---|
ụdịekere | nwoke ![]() |
mba o sị | Naijiria ![]() |
ụbọchị ọmụmụ ya | 1956 ![]() |
Ebe ọmụmụ | Enugwu Steti, Enúgwu ![]() |
Asụsụ obodo | Asụ̀sụ̀ Ìgbò ![]() |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Bekee, Asụ̀sụ̀ Ìgbò, pidgin Naịjirịa ![]() |
ọrụ ọ na-arụ | omee ![]() |
ụdị ọrụ ya | theater arts ![]() |
okpukpere chi/echiche ụwa | Efefe Kraịst ![]() |
Ụcha ime anya | brown ![]() |
ụcha ntụtụ isi | Ntụtụ ojii ![]() |
ihe nkiri | Ordinary Fellows, The Wedding Party 2: Destination Dubai, The Ghost and the Tout, Dear Affy ![]() |
Ihe nrite | Best of Nollywood Awards ![]() |
nnọchiaha nkeonwe | L305216, L485 ![]() |
Chiwetalu Agu Audio (amụrụ ya na afọ 1956) bụ aka ochie na ime ihe nkiri ọbu kwa nwa afọ Igbo onye Nigeria, [1] na eme ihe nkiri na ato ochi. Na afọ 2012 ọnwetara onyinye Nollywood dị ka 'ọ kacha mma omee ihe nkiri na asụsụ obodo ha nke na abụghị bekee'. [2] Otu Agu si eji asụsụ Igbo ekwu okwu na akpa ọchi ana akpọ 'slangs' na asụsụ bekee na nkebi ahịrịokwu ma ọ bụ clichés na ihe nkiri ọ bụla ya, mere ka ọburu onye amara amaa na Naijiria na n'etiti ndị ihe Nollywood na amasị ná mba ọzọ. [3] A na-ekwusi ike na ihe nkiri na-atọ ọchị Genres bụ ihe pụrụ iche ma buru ụgbọala na imepụta omenaala mba ụwa niile ma nke Nigeria. Na iga na ihụ, ihe nkiri na-atọ ọchị nwe kwa ike ịtọlite ma guzosie akara Nollywood ike. Edepụtara Agu dị ka otu n'ime ndị pụtara ìhè comedians onye so mee ka mmepe nke ngalaba ihe nkiri Nollywood na atọ ọchị ka Prof. Femi Shaka nke Mahadum Port Harcourt kwuru. [4] Agu lụrụ Nkechi ma nwee ụmụ nwoke atọ na ụmụ nwanyị abụọ.
Obibia nke Agu [5] bidoro na ntụgharị nke ihe nkiri onyonyo nke Naịjirịa ghọọ fim Nollywood . Tupu Nollywood amalite, ihe dịka afọ iri atọ na otu gara aga, opera telivishọn (ihe nkiri onyonyo) bụ usoro nke oge ahụ. Agu soro ma gosipụtara onye ya na Ikoro ihe nkiri nke Nigerian Television Authority Channel 8 nke Enugwu, nke Joe Onyekwelu mepụtara. O so kwa ndị ETV Channel 50, ugbu a bu ESBS . [6] na ihe nkiri dị ka Baby Come Now na Ripples (na Lagos ), nke nwanne nwoke Chico Ejiro, Zeb mepụtara.
E nwere ihe ndekọ ihe nkiri nke dị karịa otu narị na iri ise nke Agu so mee . [7]
Afọ | Ihe nkiri | Ọrụ | Rịba ama |
---|---|---|---|
Last Ofalla 1-4 | |||
Taboo | Ichie Ogwu | ||
1986 | Things Fall Apart | ||
Ripples | |||
2008 | Return of Justice | ||
Traditional Marriage 1 & 2 | |||
Fire on the Mountain 1 & 2 | |||
Price of the Wicked | |||
Dr. Thomas | ya na Sam Loco Efe | ||
The Priest Must Die | |||
The Price of Sacrifice | |||
The Catechist | |||
Police Recruit | |||
Sunrise 1 & 2 | |||
Old School 1-3 | |||
Honorable 1 & 2 | |||
Sounds of Love 1 & 2 | |||
Nkwocha | |||
Across the Niger | |||
The Plain Truth 1 & 2 |
Sounds of Love 1 & 2 | |||
Church Man 1 & 2 | Ukpabi | ||
Holy Anger 1 & 2 | |||
Evil Twin | ya na Pete Edochie | ||
Beauty and the Beast 1-3 | |||
Royal Messengers 1 & 2 | |||
Royal Destiny 1 & 2 | |||
2007 | Burning Kingdom 1 & 2 | ||
The Maidens | ya na Clarion Chukwurah | ||
Battle of the gods 1 & 2 | |||
2017 | The Wedding Party 2 | ya na Adesua Etomi | |
2019 | Ordinary Fellows [8] | ihe onyonyo nke Lorenzo Menakaya dere |
Afọ | Aha | Onye isi | Ref |
---|---|---|---|
2016 | Agbommma Cameo | Tchidi Chekere | [9] |
Agu welitere esemokwu mgbe o kwuru na ọ ga-arịọ maka ezigbo ọnụahịa [10] ma kọwaara iyi egwu mmekọahụ e boro na Nollywood dị ka okwu gbara ọkpụrụkpụ. Ọ gbakwụnyere "umu nwanyi ndị na-eme ihe nkiri Nollywood nwee ahụ dị mma". [11] Hụ kwa ajụjụ ọnụ ahụ na Daily Independent . [12]