ụdịekere | nwoke |
---|---|
mba o sị | Naijiria |
Aha enyere | Chris |
ụbọchị ọmụmụ ya | 24 Disemba 1964 |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Bekee, Asụ̀sụ̀ Ìgbò, pidgin Naịjirịa |
ọrụ ọ na-arụ | Onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị |
ebe agụmakwụkwọ | Imo State University, Ụlọ Akwụkwọ Iwu Nigeria |
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị | People's Democratic Party |
Chris Okewulonu Audio // (Onye amụrụ n'ụbọchị nke iri abụọ na anọ n'ọnwa Disemba, 1960) bụ onye ọka iwu Naijiria, onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị na onye ọchụnta ego. Ọ rụrụ ọrụ dị ka onye isi ndị ọrụ nke Emeka Ihedioha bụ Gọvanọ nke Imo Steeti site n'ụbọchị nke atọ n'ime ọnwa Juunu, 2019 ruo n'ụbọchị nke iri na ise n'onwa Jenụwarị, 2020. Ọ bụ onye otu People's Democratic Party.[1]
A mụrụ Okewulonu na Amaeke, Avutu, Obowo n'afọ 1960. A kpọrọ ya n'ọrụ ikpe n'afọ 1986 o wee malite ọrụ ọka-iwu ya na ụlọ ọrụ iwu nke Gọvanọ mbụ na-abụghị onye agha nke Imo Steeti ochie, Onye ịsị oche Sam Mbakwe. Kemgbe ahụ, ọ nọ n'ọkwá na Gọọmentị Naijiria[2] dịka onye a họpụtara n'ime Ụlọ Nzukọ nke Imo Steeti.[3] Ọ rụkwara ọrụ dị ka odeakwụkwọ ukwu, Avutu Development Union site n'afọ 1988 rue n'afọ 1999.
N'afọ 1999, ọ ghọrọ onye na-enyere gọvanọ nke Imo Steeti aka. Ma n'afọ 2001, ọ ghọrọ onye kọmishọna maka Ọrụ, Ụlọ na Ụgbọ njem na Imo Steeti.[4][5] N'afọ 2004, ọ ghọrọ Onye isi oche / Onye nhazi nke Heartland Football Club ma n'afọ 2006, a họpụtara ya dị ka SSG nke gọvanọ imo steeti.[6] N'afọ 2008, Onye isi ala Naịjịrịa bụ Goodluck Johnathan họpụtara ya ka ọ bụrụ Kọmishọna Federal, na-anọchite anya Ndịda Ebe Ọwụwa Anyanwụ n'ihe gbasara Fiscal Responsibility komishon.[7]
N'afọ 2011, a họpụtara Okewulonu dị ka onye isi nchịkwa nke Ntuli aka maka ịhọpụta gọvanọ Ikedi Ohakim. ọzọ kwa, n'afọ 2015, a họpụtakwara ya dị ka onye nduzi ukwu nke Chukwuemeka Ihediohaz Gọvanọship Campaign.[8]
N'ụbọchị mbụ nke n'ọnwa Juun afọ 2019, mgbe a ṅụrụ iyi nke Onye Ukwu[9] Chukwuemeka Ihedioha dị ka Gọvanọ Ọchịchị nke Imo Steeti, Okewulonu bụ otu n'ime ndị mbụ a họpụtara ka ha ṅụọ iyi dịka Chima Nwana na a ṅu iyi ka ọ bụrụ Onye isi ndị ọrụ ma bụrụ kwa zie osote Onye isi ndị isi dika m sị kowaa.[10][11]