ụdịekere | nwoke |
---|---|
mba o sị | Naijiria |
ụbọchị ọmụmụ ya | 19 Maachị 1991 |
Ebe ọmụmụ | Lagos |
Asụsụ obodo | Asụ̀sụ̀ Ìgbò |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Asụ̀sụ̀ Ìgbò, Bekee, pidgin Naịjirịa |
ọrụ ọ na-arụ | onye ọkpụkpọ basketball |
ọnọdụ egwu na otu / ọpụrụiche | ike n'ihu |
oge ọrụ ya (mmalite) | 2011 |
onye nsonye òtù egwuregwu | Motor City Cruise |
ụdị egwuregwu | Basketball |
drafted by | Los Angeles Lakers |
otu egwuregwu | NBA G League |
Chukwudiebere " Chu " Maduabum Audio (amụrụ ya na Machị 19, 1991), mgbe ụfọdụ ana - akpọ kwaya " Chuk ", " Chuck ", ma ọ bụ " Chu Chu ", bụ onye egwuregwu basketball nke Naịjirịa. Ndị Los Angeles Lakers gụnyere ya na 56th n'oge 2011 NBA draft tupu ha're ikike ya nye Denver Nuggets .
Maduabum, onye toro nnukwu ogologo 6'9 " na atu bọl nkata ọfụma na oso na ndị na anọ n'ihu egwuregwu. Ọ bụ ọkpụkpọ onye egwuregwu nke atọ akpọrọ ozugbo site na D-League, na-esote ndị ọzọ dịka Mike Taylor na Latavious Williams . Ọ gbara otu egwuregwu abụọ mgbe ọ nọ na Naịjirịa tupu ọ gaa D-League: ndị Dodan Warriors na Kano Pillars. Ọ gbakwara egwuregwu bọl na FIBA Africa Club Championship.
Na Machị 18, 2011,Maduabum bidoro ọrụ bọọlụ na nke ndị Bakersfield Jam naágba na NBA D-League. [1] Ọ turu bọl wee nweta akara nke nkezi 0.7 ya na 1.0 nkanka na egwuregwu atọ n'oge 2010-11 .
Na ụbọchị iri abụọ na atọ na ọnwa June, n'afọ 2011, ndị isi ụlọ ọrụ Los Angeles Lakers họpụtara Maduabum na ntuli aka 56th na 2011. E mechara ndị Denver Nuggets kpọrọ Maduabum. [2]
Na ọnwa Jenụwarị 24, n'afọ 2012, ndị Bakersfield Jam kpọghachitere Maduabum. Kaosinadị, a hapụrụ ya na February 1, 2012 ka ọgba naanị otu egwuregwu n'ihi mmerụ ahụ. [3]
Na July 2012, Maduabum sonyere ndị Nuggets maka NBA Summer League nke 2012 ebe ọ gbagoro ihe ruru akara 2.3 na 2.7 na egwuregwu atọ. [4]
Na Febụwarị 19, 2015, ndị Nuggets zụrụ ahịa na Maduabum, yana JaVale McGee na ndị ga-agba okirikiri nke mbụ site na Oklahoma City Thunder, gaa na Philadelphia 76ers . [5]
Na ụbọchị iri na asatọ nke ọnwa Febụwarị, n'afọ 2016, ndị 76ers nyefere Maduabum na aka ndị Houston Rockets dịka akụkụ nke azụmahịa atọ ndị na egwuregwu ha egwu bọl. Ndị Detroit Pistons sokwa na azụmahịa. [6] Agbanyeghị, nka ikike laghachiri ndị 76ers ụbọchị anọ ka e mechara, maka ndị Pistons kwụsịrị ahịa ahụ n'ihi Donatas Motiejūnas onye nke iyocha ahụ ya agaghi ọfụma . [7] [8]
Na Jenụwarị 2013, Maduabum na Al-Shamal nke Qatar's D1 league bịanyere aka nkwekọrịta ebe ọ turu bọl di'egwu nwete akara gosire na ọ na arụ ọrụ ya nke ọma.
Na Nọvemba n'afọ 2013, Maduabum na Tallinna Kalev nke Estonia binyere aka na nkwekọrịta maka oge bọl nke 2013–14. [9] Na Disemba 2013, ọ hapụrụ Tallinna mgbe ọ gwuchara egwuregwu asọmpi nke atọ na Estonia na abụọ nke Baltic League.
Na Jenụwarị 2014, Maduabum na Khasiin Khuleguud nke Mongolia bianyere aka na nkwekọrịta maka oge foduru na 2013 –14. [10] Ọ gara n'ịhu na-enweta nturu ugo nke asọmpị All-Star. Onye kwa'ra ndi Klob ahụ aka nweta imeri na asọmpi n’afọ 2014.
Ka ọnwa Nọvemba dị na mkpụrụ ụbọchị abụọ n’afọ 2014, ndị Fort Wayne Mad Ants nwetara Maduabum dị ka onye egwu bọl. [11] Na Disemba 2, 2014, ndị Mad Ants hapụrụ ya mgbe ọ pụtachara na egwuregwu anọ. [12]
N’ụbọchị itoolu na ọnwa Jenụwarị , 2015, Maduabum na Tallinna Kalev bianyere aka nkwekọrịta ọzọ. Mana ọ mechara hapụ ndị klọb ahụ bu Tallinna Kalev. [13]
Na ụbọchị asaa na Ọgọstụ, 2015, Maduabum na Keflavík nke Icelandic Premier League bianyere aka mgbe egwuregwu ya gbachani'te ọfụma n'oge ọ na gbara ndi Tallinna Kalev. [14]
N'ime ọnwa Septemba, Maduabum bịanyere aka na nkwekọrịta ọrụ ya na ndị Finnish Korisliiga team Tampereen Pyrintö na'ebe ọgba bọl nkata ugboro asato . Ọ gbakwara otu egwuregwu maka ndị Pyrintö II na Nkebi nke mbu.[15][16]
N'oge ndị ọzọ na afọ 2015-16, Maduabum gwuru egwuregwu bọl nkata na Gegeen Khangai Leader na mba Mongolia. Emechara kpọọ ya nnukwu nmadu nke na eme ihe ahụ dị iche n'afo abụọ n'oge bọl na Mongolia.
Na ụbọchị iri abụọ na mbụ nke ọnwa Septemba n'afọ 2016, Maduabum na Kagoshima Rebnise nke ngalaba nke abụọ nke Japanese bianyere aka nkwekọrịta. [17] Na July n'afọ 2017, ọ kwagara Cyberdyne Ibaraki Robots . [18] Na August 2018 ya na Passlab Yamagata Wyverns nwekwa nghọta. [19]