ụdịekere | nwoke ![]() |
---|---|
mba o sị | Njikota Obodo Amerika ![]() |
aha enyere | Daniel ![]() |
ụbọchị ọmụmụ ya | 1963 ![]() |
Ebe ọmụmụ | Ellaville ![]() |
ọrụ ọ na-arụ | onye ese, onye na-akpụ ihe ọkpụkpụ, postage stamp designer ![]() |
ikike nwebiisinka dị ka onye okike | Ọrụ nwebiisinka chekwara ![]() |
Daniel Minter (amụrụ n'afọ 1961, Ellaville, Georgia) bụ ónyé Africa-America na-ese ihe na ónyé nkuzi na-arụ ọrụ na eserese, ihe ọkpụkpụ, ihe osise, mgbakọ, na nka ọha.[1][2][3]
Minter nwetara A.A. ya site na Art Institute nké Atlanta. N'afọ 2019, ọ natara Honorary Doctorate of Arts site na Maine College of Art .
Na mbido ọrụ ya, Minter rụrụ ọrụ dị ka ónyé na-ese ihe osise.[4] O gosipụtara akwụkwọ ụmụaka iri na abụọ, gụnyere mmekọrịta abụọ na ónyé edemede Kelly Starling Lyons: Ella's Broom, nké meriri 2013 Coretta Scott King Book Honor, na Going Down Home with Daddy, nké bụ ónyé natara Caldecott Honor nke 2020.
Minter emeela stampụ Kwanzaa abụọ màkà United States Postal Service, nkè e wepụtara na 2004 na 2011.[5][6][7]
Minter bi ugbu a na Portland, Maine, ebe ọ na-aga n'ihu n'ọrụ okike ya ma na-enyere aka na The Underground Railroad, nke ọ bụ ónyé otu.[8] Ọrụ Minter apụtala n'ọtụtụ ihe ngosi na Portland ma enwere ike ịhụ ya na ákàrà ngosi nkè Underground Rail-Road na Maine Interfaith Youth Alliance.