ụdịekere | nwanyị |
---|---|
mba o sị | Kameroon |
aha enyere | Delphine |
aha ezinụlọ ya | Atangana |
ụbọchị ọmụmụ ya | 16 Ọgọọst 1984 |
Ebe ọmụmụ | Yaoundé |
ọrụ ọ na-arụ | asọmpi egwuregwu |
ụdị egwuregwu | egwuregwu |
so na | 2012 Summer Olympics, 2004 Summer Olympics, 2006 Commonwealth Games |
Delphine Bertille Atangana (amụrụ n'abalị iri na isii n'ọnwa Ọgọstụ n'afọ 1984 na Yaoundé) bụ onye Cameroon na-agba ọsọ nke bụ ọkachamara na mita 100.
Na afọ 2006 Commonwealth Games ọ meriri ọla nchara na 100 mita wee bụrụ onye nke asaa na 200 mita. O mekwara asọmpi na afọ 2004 Olympic Games, 2005 World Championships, 2008 World Indoor Championships,na afọ 2011 World Championships. O meriri ọla edo na 200m na Afro-Asian Games.
Oge kachasị mma ya bụ 11.24 sekọnd, nke o nwetara n'ọnwa Ọktoba afọ 2003 na Abuja. O nwere 23.26 sekọnd na mita 200, nke o nwetara n'April 2003 na Bron, na 7.19 sekọnd n'ime mita 60, nke o nwetara na Febuwari, na afọ 2006 na Aubière. O nwekwara ihe ndekọ mba na 4 x 400 mita relay na 3:27.08 nkeji, ya na ndị otu Mireille Nguimgo, Carole Kaboud Mebam na Hortense Béwouda na 2003 World Championships na Paris.