ụdịekere | nwanyị ![]() |
---|---|
mba o sị | France ![]() |
aha n'asụsụ obodo | Dominique Prieur ![]() |
Aha ọmụmụ | Dominique Maire ![]() |
aha enyere | Dominique ![]() |
aha ezinụlọ ya | Prieur, Maire ![]() |
aha pseudonym | Sophie Turenge ![]() |
ụbọchị ọmụmụ ya | 1949 ![]() |
Ebe ọmụmụ | Besançon ![]() |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | French language ![]() |
place of detention | Mount Eden Prisons, Auckland Prison ![]() |
convicted of | manslaughter ![]() |
ọrụ ọ na-arụ | pioneer, spy, military officer, chief human resources officer ![]() |
ebe agụmakwụkwọ | Dijon University ![]() |
ọkwa agha | colonel, commanding officer ![]() |
Onye òtù nke | Directorate-General for External Security ![]() |
ihe omume dị ịrịba ama | Mmiri nke Rainbow Warrior ![]() |
Dominique Prieur (amụrụ nafọ 1949) bụ onye agha French nke a mara ikpe igbu ọchụ maka òkè ya na Egwurugwu dike
Prieur sonyeere ndị agha nafọ 1974 ma bụrụ onye ọrụ nzuzo n'ọnwa Ọgọstụ afọ 1977.[1]
Prieur rụrụ ọrụ na ngalaba nchịkọta ihe ọmụma na nyocha nke French Secret Service, Direction Générale de la Sécurité Extérieure (DGSE). Ọ bụ ọkachamara na òtù udo nke Europe ma bụrụ onye nchịkwa nke Christine Cabon.[2] E zigara Cabon na Auckland nọnwa Eprel nafọ 1985, ebe ọ banyere nọfịs Greenpeace wee chịkọta ozi maka Prieur na onye ọrụ ibe ya Alain Mafart.[2] Nọnwa Julaị n'afọ 1985, Prieur na Mafart si Corsica banye New Zealand na paspọtụ Switzerland nyere aha ha bụ Sophie na Alain Turenge, di na nwunye ọhụrụ naaga ezumike.[3][4] Ntuziaka ha bụ ka ha mikpuo Egwurugwu dike ka gọọmentị France naenyo enyo na a gaeji ya mee mkpesa maka nnwale nuklia naabịanụ na Mururoa atoll na South Pacific.[3] Ọrụ Prieur bụ nhazi nke ọrụ ahụ, na mwepụ nke ndị ọrụ si na mba ahụ mgbe bọmbụ ahụ gasịrị.[5]
Prieur na Mafart wetara ndị frogmen abụọ ogbunigwe limpet ka ha kụọ nụgbọ mmiri ahụ nabalị nke 10 Julaị 1985.[6] Mgbawa ahụ mikpuru ụgbọ mmiri ahụ ma gbuo onye na-ese foto Fernando Pereira.[7][3]
Ndị uwe ojii New Zealand jidere ha nime awa 30 nke bọmbụ ahụ, ma boo ha ebubo igbu Pereira.[8] A kpọfere Prieur nụlọ mkpọrọ ụmụ nwanyị nke Christchurch ma debe ya nebe ahụ ka ọ naechere ikpe.[9] Prieur kwupụtara ebubo igbu ọchụ na mmebi iwu nụlọ ikpe mpaghara Auckland, a mara ya ikpe ịga mkpọrọ afọ iri na 22 Nọvemba 1985.[9][10][11] Mgbe nrụgide ndọrọ ndọrọ ọchịchị siri ike sitere na France na ndị enyi ya, gọọmentị New Zealand kwetara na mkpebi ikpe nke United Nations na July 1986 nke hụrụ ka a kpọfere ha abụọ naka ndị France na agwaetiti Hao na French Polynesia.[12]
E zigara di Prieur, Joel Prieur, onye ọrụ nke Ngalaba Nchebe, na Hao obere oge ka a chụgara ya ebe ahụ.[13] Na 6 Mee 1988 a laghachiri ya na France nihi na ọ dị ime, a kpọkwara ya dike mba.[13][14] Ọ laghachighị na Hao.
Ọ bụ ezie na otu kọmitii Arbitration nke UN chọpụtara na France emebiela ọrụ ya na New Zealand ọtụtụ ugboro site niwepụ ndị ọrụ na Hao, ma ghara iweghachi ha, ọ jụrụ nkwupụta nke New Zealand na Mafart na Prieur laghachiri nihi na oge ha kwesịrị ịnọ ebe ahụ adaala.
Nafọ 1989, e buliri Prieur ka ọ bụrụ Major, ka ọ naerule afọ 2002, e buliri ya ka ọ bụrụ Commandant.[4][9]
Prieur bipụtara akwụkwọ "Agent secrète" (Secret Agent) na 1995 gbasara ọrụ ya na bọmbụ ahụ. Banyere ọnwụ Pereira, o dere "Anyị tụrụ egwu ma wụọ egwu. Anyị abịaghị ebe a igbu onye ọ bụla. "[15]
Nafọ 2005, Prieur na Marfart rịọrọ Ụlọikpe Kasị Elu nke New Zealand ka ha kwụsị igosi arịrịọ ikpe ha na telivishọn.[16] Ụlọikpe kachasị elu nyere ohere ka ihe nkiri ahụ gaa na ikuku.[16]
Nafọ 2009, e were Prieur nọrụ dị ka onye nduzi nke ndị ọrụ mmadụ maka Paris Fire Brigade, otu nke ndị agha France.[15][17]
<ref>
tag; name ":4" defined multiple times with different content
<ref>
tag; name ":6" defined multiple times with different content
<ref>
tag; name ":7" defined multiple times with different content
<ref>
tag; name ":3" defined multiple times with different content