Aboriomoh Femi Raymond, onye a maara aha ya bụ Dremo, bụ onye Naijiria na-ede egwu, onye na-agụ egwu, onye na-emepụta ihe ndekọ, onye na-edekọ egwu, na onye na-eme ihe nkiri.[1] Ọ na arụ ọrụ na Davido Music Worldwide (DMW) ugbu a.[2]
Dremo si Edo Steeti, Naịjirịa ebe a mụrụ ya, mana o tolitere na obodo Ibadan, Oyo Steeti.[1] Ọ gara George na Duke High School na Ibadan, o mechara hapụ National Open University of Nigeria mgbe afọ nke abụọ ya gasịrị iji nweta oru na DMW.[3]
Dremo malitere egwu mgbe ọ bịanyere aka na ntụrụndụ egwu A.P.P.E, ebe ọ wepụtara 'Normal Levelz' na 'OBT'.[4]
Na 5 Eprel na afọ 2016, Davido tinyere Dremo na Mayorkun bịanyere aka na Davido Music Worldwide.[5][2][3] Na 20 Julaị na afọ 2018, Dremo wepụtara EP izizi nke akpọrọ “Codename Volume 1”.[6] N'abalị iri abụọ na isii n'ọnwa Ọgọstụ na afọ 2019, o wepụtara EP nwere egwu ise, “Icen B4 the Cake” dị ka ihe na-esote “Codename Volume 1”.[7] Na 17 Eprel na afọ 2020, o wepụtara “Codename Volume 2” na egwu iri na abụọ.[8][9][10] Na 23 Eprel, Dremo na Jeriq wepụtara EP 'Ea$t N We$t’.[11] N'ọnwa Ọgọstụ 4 na afọ 2021, o wepụtara otu egwu nke gosipụtara Patoranking nke akpọrọ 'Wonder' .[12][13]