Ụlọ ọrụ mmepụta ihe | ụlọ ọrụ ihe nkiri, Ihe nkiri nke Naịjirịa, ụlọ ọrụ ntụrụndụ |
---|---|
ụdịekere | nwoke |
mba o sị | Naijiria |
Aha ọmụmụ | Ejike Asiegbu |
aha enyere | Ejike |
aha ezinụlọ ya | Asiegbu |
ụbọchị ọmụmụ ya | 20. century |
Ebe ọmụmụ | Naijiria |
Dị/nwunye | Ogechi Asiegbu |
nwa | Etochi Ejike Asiegbu |
Asụsụ obodo | Asụ̀sụ̀ Ìgbò |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Bekee, Asụ̀sụ̀ Ìgbò, pidgin Naịjirịa |
ọrụ ọ na-arụ | omee, onye nhazi ndu ihe nkiri, omee ihe nkiri |
ụdị ọrụ ya | theater arts |
ebe agụmakwụkwọ | University of Port Harcourt |
ogo mmụta | Bachelor of Arts, bachelor's degree |
oge ọrụ ya (mmalite) | 1996 |
okpukpere chi/echiche ụwa | Efefe Kraịst |
Ụcha ime anya | brown |
ụcha ntụtụ isi | Ntụtụ ojii |
Ihe nrite | Africa Movie Academy Awards, Best of Nollywood Awards, City People Entertainment Awards |
nnọchiaha nkeonwe | L485 |
Ejike Asiegbu // (na-ege ntị) bụ onye Naijiria na-eme ihe nkiri na onye nduzi ihe nkiri nke jere ozi dị ka onye isi oche nke otu omee ihenkiri ndị na-eme egwuregwu nke Naijiria.[1][2] A họpụtakwara ya n'oge gara aga dị ka onye na-enyere onye isi Biafra Odumegwu Ojukwu aka n'oge ahu, n'afọ otu puku, narị iteolu na iri iteolu n'anọ1(994) Ọgbakọ Mba Ome iwu na Abuja.[3]
Ejike Asiegbu gụrụ akwụkwọ praịmarị na ụlọ akwụkwọ Constitution Crescent praimarị na Aba, Abia Steeti, Nigeria, mana ọ gụsịrị akwụkwọ praịmarị na ụlọ akwụkwọ nke St. Maryńs dị na Lokoja, Kogi Steeti. Mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ praịmarị, Ejike Asiegbu gara Abdul Azeez Attah Memorial College, Okene na Kogi Steeti, Nigeria, mana ọ gụsịrị ụlọ akwụkwọ sekọndrị na Christ the King College (CKC) na Onitsha, Anambra Steeti, Naijiria n'afọ otu puku, nari iri iteolu na iri asatọ (1980).
Mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ sekọndrị ya, Ejike Asiegbu gara Mahadum Port Harcourt na Rivers Steeti, Naijiria wee gụsịrị akwụkwọ na nzere bachelọ na Theatre Arts n'afọ otu puku, nari iteolu na iri iteolu n'iteolu (1993).
Ejike Asiegbu sonyeere ụlọ ọrụ ihe nkiri Naijiria (Nollywood) n'afọ otu puku, nari iteolu na iri iteolu n'isii (1996) wee mee ihe nkiri mbụ ya bụ "Sylent Night" ihe nkiri nke mere ka ọ bụrụ onye ama ama. Ọ na-emekarị ihe nkiri na ihe nkiri ya na Pete Edochie, Clem Ohameze, Kanayo O Kanayo na Kenneth Okonkwo.
Ejike Asiegbu meriri ọtụtụ onyinye nke gụnyere; *Onye na-eme ihe nkiri kacha mma n'afọ na Afrika Magic Viewers Choice Awards,
Ejike lụrụ Ogechi Asiegbu, ma nwee ụmụ anọ, gụnyere Etochi Ejike Asiegbu.