ụdịekere | nwanyị |
---|---|
mba o sị | Naijiria |
aha enyere | Evelyn |
ụbọchị ọmụmụ ya | 3 Febụwarị 1995 |
Ebe ọmụmụ | Lagos |
ọrụ ọ na-arụ | onye ọkpụkpọ basketball |
ọnọdụ egwu na otu / ọpụrụiche | forward |
ebe agụmakwụkwọ | Chipola College, University of Kentucky |
oge ọrụ ya (mmalite) | 2017 |
onye nsonye òtù egwuregwu | Kentucky Wildcats women's basketball, Dallas Wings, Beşiktaş Women Basketball Team |
ụdị egwuregwu | Basketball |
drafted by | Dallas Wings |
so na | 2017 FIBA Africa Championship for Women, 2018 FIBA Women's Basketball World Cup |
otu egwuregwu | Women's National Basketball Association |
Evelyn Akhator Audio (onye a muru n'ụbọchị nke 3 n’onwa Febụwarị nke afọ1995) bu onye Naijiria na-eme egwuregwu basketbọọlụ ndi nwanyi n’ihu / etiti nke otu Flammes Carolo . [1] [2] Ndi Dallas Wings nke Women’s National Basketball Association (WNBA) họọrọ ya dika onye nke ato n’ozuzu nke 2017 WNBA Draft . [3]
Isi nrụtụaka [4]Àtụ:NBA player statistics legend
Afọ | Otu | GP | Ọnụọgụ | FG% | 3P% | FT% | RPG | APG | SPG | BPG | PPG |
---|---|---|---|---|---|---|---|---|---|---|---|
2015–16 | Kentucky | 33 | 380 | 51.0% | 100.0% | 57.8% | 9.2 | 0.7 | 1.1 | 1.0 | 11.5 |
2016–17 | Kentucky | 33 | 526 | 56.8% | 0.0% | 68.9% | 10.8 | 1.0 | 1.4 | 0.9 | 15.9 |
Ọrụ | 66 | 906 | 54.1% | 33.3% | 64.5% | 10.0 | 0.8 | 1.2 | 0.9 | 13.7 |
Dallas Wings họọrọ Evelyn dịka onye nke atọ na nhọpụta ntinye WNBA nke afọ 2017. Ọ pụtala n'asọmpi iri na ise na oge ruki ya n'akụkụ nke Dallas [5] ebe ọ na-enye ọnụọgụ 0.9 n'egwuregwu ọ bụla, ọnụọgụ 0.2 blocks kwa egwuregwu, ọnụọgụ 0.1 kwa egwuregwu. [6] Ndi Dallas Wings gbahapụrụ ya n;ụbọchị nke 13 n'ọnwa Mee nke afọ 2018. [7]
N'ụbọchị nke 13 n'ọnwa Febụwarị nke afọ 2019, Akhator laghachiri WNBA site na ịbanye otu Chicago Sky na nkwekọrịta ọzụzụ. [5] [8]
Evelyn na-anọchite anya Nigerian national basketball team . Ọ pụtara mpụta izizi ya n’otu oge asọmpi FIBA Afrobasket nke afọ 2017 na Mali. [9] Evelyn jiri ihe ruru ọnụọgụ 15.3 na mweghachi 9.5 kwa egwuregwu n'oge asọmpi ahụ were depụta aha ya ndị egwuregwu 5 kacha elu. [10] Evelyn so na ndị Nigerian national basketball team na 2018 FIBA Women's Basketball World Cup ebe ọ ritere ihe ruru ọnụọgụ 12.6, mweghachi 9 na mnyere aka 1.4 oge asọmpi ahụ. [11]
Akhator nwetara ọtụ na Rọshia n'otu WBC Dynamo Novosibirsk n'afọ 2017. O nwetara ihe ruru ọnụọgụ 12.4 na mweghchi 8.5 kwa egwuregwu. [12] [13]
N'ụbọchị nke 22 n'ọnwa Ọgọst afọ 2018, Akhator bịanyere aka n'otu basketbọọlụ Turkish Besiktas. [12] [14] O jiri akara iri na ise na mwrghachi 11 na otu egwuregwu nke asọmpi egwuruegwu Tọki, o nwetakwara akara iri na ise na mweghachi n'asọmpi Eurocup na-igwuri egwu karịrị nkeji iri atọ na mpi abụọ ahụ. [15]
Ahkator bịanyere aka n'otu Spanish CB Avenida n'ụbọchị nke 15 n'ọnwa Mee nke afọ 2019. [16] [15]
N'ọnwa Nọvemba, afọ 2019, Ahkator binyere aka i sonye ndị otu basketbọọlụ Flammes Carolo nke Frans. [17] [18] [19]
Na 2018 Nigerian Sports Award, Akhator meriri n'onyinye nke Best Sportwoman na Basketball player. [20]
Akhator sitere n'ezinụlọ nke mmadụ atọ, nne na nna ya na nwanne ya nke okenye bi na Naijiria. [21] Nne ya Benedicta nwụrụ n'ihe mberede okporo ụzọ. [22]