ụdịekere | nwanyị ![]() |
---|---|
mba o sị | Morocco ![]() |
aha enyere | Fatima ![]() |
ụbọchị ọmụmụ ya | 1954 ![]() |
Ebe ọmụmụ | Rabat ![]() |
Dị/nwunye | Aziz Daouda ![]() |
nwa | Kawtar Daouda, Tariq Daouda ![]() |
Asụsụ obodo | Berber languages ![]() |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Arabic, Berber languages ![]() |
ọrụ ọ na-arụ | asọmpi egwuregwu ![]() |
ebe agụmakwụkwọ | Université de Montréal ![]() |
ụdị egwuregwu | egwuregwu ![]() |
so na | 1972 Summer Olympics ![]() |
Fatima El-Faquir (amụrụ n'afọ 1954) bụ onye Morocco na-agba ọsọ, onye nkuzi, na prọfesọ egwuregwu. Ọ bụ onye Morocco mbụ na-asọ mpi na Olimpik.[1] O sonyere na 100 mita ụmụ nwanyị na afọ 1972 Summer Olympics na Munich ma bụrụ onye mmeri Afrịka mbụ na 400m hurdles na Dakar na 1979.[2] Ọ bụ nwanyị mbụ na-eme egwuregwu nyere Morocco aha. Ọ bụ Prọfesọ nke agụmakwụkwọ dị elu na Moroccan National Institute of Sport .
El-Faquir gụrụ Physical Exercise and Sport na Mahadum Bucharest na Romania site na afọ 1973 ruo na afo 1978 wee gaa Mahadum Montreal na Canada. Ọ lụrụ di ma zụlite ezinụlọ ya na onye nkuzi ya bụ Aziz Daouda. Ọ zụrụ ndị otu egwuregwu mba Morocco (track) ma zụọ Nawal El Moutawakel na huders na relay events.[2]
Ọ haziri ihe omume dị ka Pan Arab Games na Rabat, Morocco na 1985, Francophone Games na afọ 1989, Cross Country World Championship na afọ 1998, na Youth World Championships na Marrakech na afọ 2006. Ọ nwere ọkwa onye isi ala na Confederation of African Athletics, North Africa, na National Association of Women's Physical Activities and Sport.[3][4]
N'afọ 2017, ọ gbachitere akwụkwọ edemede ya n'asụsụ French nke akpọrọ "Moroccan High Level Athletes: Emergence, Visibility, Erasure 1956-2016."[1]
<ref>
tag; name ":1" defined multiple times with different content
<ref>
tag; name ":0" defined multiple times with different content