Fatima Marouan

Fatima Marouan
mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịMorocco Dezie
aha n'asụsụ obodoفاطمة مروان Dezie
aha enyereFatima Dezie
ụbọchị ọmụmụ ya1952 Dezie
Ebe ọmụmụBen Slimane Dezie
Asụsụ obodoBerber languages Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBerber languages, Arabic Dezie
ọrụ ọ na-arụendocrinologist, Onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị, physician Dezie
onye were ọrụUniversity of Hassan II Casablanca Dezie
ebe agụmakwụkwọUniversity of Lyon Dezie
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchịNational Rally of Independents Dezie

Fatima Marouan, nke a na-akpọkwa Fatema Marouane, (amụrụ n'afọ 1952) bụ dọkịta Moroccan, onye isi azụmaahịa na onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Site na afo 2002 ruo na afọ 2005, ọ bụ onye isi nke Endocrinology na Metabolic Diseases nke Ụlọ Ọgwụ Mahadum Ibn Rochd na Casablanca.[1] N'oge na-adịbeghị anya, n'okpuru ọchịchị nke Praịm Minista Abdelilah Benkirane, site n'October na afọ 2013 ruo Eprel, na afọ 2017 ọ rụrụ ọrụ dị ka Minista nke Crafts na Social Economy dị ka onye otu National Rally of Independents.[2]

Akụkọ ndụ

[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ ya na afọ 1952 na Benslimane n'ebe ọwụwa anyanwụ nke Casablanca, Fatima Maroun gụrụ ọgwụ na Mahadum Lyon. Ọ ghọrọ Onye Ọkachamara na onye nchọpụta na Ngalaba Ọgwụ na Ọgwụ nke Mahadum Casablanca. N'ịbụ onye ọkachamara na endocrinology na nsogbu nri na-edozi ahụ, ọ bụ onye isi nke Ngalaba Endocrinology, Diabetology na Nutrition na Ụlọ Ọgwụ Ibn Rochd na Casablanca. Maroun bụ onye otu Moroccan commission on combating diabetes.[3] Ọ gara n'ihu bụrụ onye isi Smedian (Société marocaine d'ãoendocrinologie, diabétologie et nutrition).[4] Fatima Marouan enyewo aka n'ọtụtụ akwụkwọ sayensị.[5]

N'ihu ndọrọ ndọrọ ọchịchị, dị ka onye otu National Rally of Independents, o sonyere na mmepe nke atụmatụ ahụike na agụmakwụkwọ. Site n'ọnwa Ọktoba afọ 2013 ruo n'afọ 2017, ọ rụrụ ọrụ dị ka Minista na-ahụ maka ọrụ aka na akụ na ụba ọha na eze.[4]

Maroun bụkwa onye otu ụlọ ọrụ Casablanca Chicago Sister Cities Association. Ọ na-asụ asụsụ atọ, na-asụ asụsụ Arabic, asụsụ French na asụsụ Bekee.[6] Onye otu sayensị nke Destination Santé S.A.S, ọ rụkwara ọrụ na ụlọ ọgwụ California Cardiology Clinic nke Casablanca.[1]

Fatima Maroun lụrụ di ma muo ụmụ abụọ.[3]

Ebenside

[dezie | dezie ebe o si]
  1. 1.0 1.1 Fatima Marouan. Bloomberg. Retrieved on 16 October 2018.
  2. Biographie de Mme Fatema Marouane : ministre de l'Artisanat, de l'Economie sociale et solidaire (French). MAP Express (10 October 2013). Retrieved on 16 October 2018.
  3. 3.0 3.1 Biographie de Mme Fatema Marouane: ministre de l'Artisanat, de l'Economie sociale et solidaire (French). Royaume du Maroc. Archived from the original on 26 June 2016. Retrieved on 17 October 2018.
  4. 4.0 4.1 Fatima Marouanbladi.net. Retrieved on 17 October 2018.
  5. Fatima Marouan's scientific contributions. Research Gate. Retrieved on 17 October 2018.
  6. Fouzar, Loubna (11 October 2013). Profile of Fatema Marouane, Minister of Handicrafts, Social Economy and Solidarity. Morocco World News. Retrieved on 17 October 2018.