ụdịekere | nwanyị |
---|---|
mba o sị | Naijiria |
aha n'asụsụ obodo | Florence Omagbemi |
aha enyere | Florence |
aha ezinụlọ ya | Omagbemi |
aha gọọmenti | Florence Omagbemi |
ụbọchị ọmụmụ ya | 2 Febụwarị 1975 |
Ebe ọmụmụ | Naijiria |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Bekee, pidgin Naịjirịa, Asụsụ Yoruba |
ọrụ ọ na-arụ | Onye otu egwuregwu bọọlụ |
ọnọdụ egwu na otu / ọpụrụiche | etiti etiti |
Ụcha ime anya | brown |
ụcha ntụtụ isi | Ntụtụ ojii |
ụdị egwuregwu | footbọl |
so na | 2000 Summer Olympics |
Florence Omagbemi (amuru na ubochi nke abụọ na ọnwa Febrụwarị 1975) bu onye Naijiria ama ama n'egwuregwu bọọlụ . Ọ so na otu egwuregwu bọọlụ ụmụ nwanyị Naịjirịa gafee asọmpi iko mba ụwa nke FIFA anọ, ọtụtụ iko mba Africa na asọmpi olimpik nke afọ 2000 . N'afọ 2016, a họpụtara ya onye nchịkwa nwa oge nke otu mba, ebe ọ bụbu osote onye nkuzi n'otu egwuregwu bọọlụ ụmụ nwanyị Naịjirịa na-erubeghị afọ 20 .
Omagbemi gbara otu egwuregwu bọọlụ ụmụ nwanyị Naịjirịa ihe karịrị afọ iri, ọ pụtara n'asọmpị iko mba ụwa nke anọ nke FIFA gụnyere ịbụ onye so na otu ndị rutere agba nke abụọ n'afọ 1999 tupu ha emerie Brazil . [1] Dị ka onye isi, o jiri ndị Super Falcons merie asọmpi iko mba Afrịka ugboro anọ na 1998, 2000, 2002 na 2004 . Ọ sokwa na ndị otu Naijiria bụ ndị gbara asọmpi Summer Olympic nke mbụ n'asọmpi 2000 na Australia. [2]
Omagbemi malitere ọrụ nkuzi egwuregwu boolu ya na ọtụtụ otu ndị ntorobịa nọ na America, tupu akpọọ ya ka ọ bụrụ osote onye nkuzi maka otu egwuregwu bọọlụ ụmụ nwanyị Naịjirịa na-erubeghị afọ iri abụọ . Mgbe ha nọ n'ọnọdụ ahụ, ndị otu ahụ ruru ọkara ikpeazụ nke 2012 FIFA U-20 Women's World Cup tupu United States ewepụ ya. Akpọrọ Omagbemi ka ọ bụrụ onye nkuzi nwa oge nke otu nnukwu mba maka asọmpi iko mba Afrịka nke 2016 . Naijiria enwebeghị onye nchịkwa kamgbe a chụrụ Christopher Danjuma n'ọrụ n'ihi adịghị mma otu a na- eme n'egwuregwu Africa 2015 . [2]
Otu ọnwa tupu asọmpi a ebido, ekpughere na akwughi Omagbemi ụgwọ ya n'aka ndị otu egwuregwu bọọlụ Naịjirịa . Na nzaghachi, NFF kwere nkwa na a ga-akwụ ya ụgwọ tupu ndị otu a pụọ maka asọmpi a. [3]
Na ubochi atọ nke Disemba 2016 Florence Omagbemi ghọrọ nwanyị mbụ meriri iko mba Afrịka dịka onye ọkpụkpọ na onye nchịkwa.
Dị ka onye ọgba boolu
Dị ka onye nchịkwa