Folashade Yemi-Esan | |
---|---|
Born | Folashade Mejabi 13 Ọgọstụ 1964 Kaduna State, Nigeria |
Alma mater | University of Ibadan |
ụdịekere | nwanyị ![]() |
---|---|
mba o sị | Naijiria ![]() |
aha n'asụsụ obodo | Folashade Mejabi Yemi-Esan ![]() |
aha enyere | Folashade ![]() |
aha gọọmenti | Folashade Mejabi Yemi-Esan ![]() |
ụbọchị ọmụmụ ya | 13 Ọgọọst 1964 ![]() |
Ebe ọmụmụ | Kaduna Steeti ![]() |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Bekee ![]() |
ọrụ ọ na-arụ | civil servant ![]() |
nnọchiaha nkeonwe | L484 ![]() |
Folashade Mejabio Yemi-Esan CFR (née Mejabi; amụrụ n'abalị iri na atọ n'ọnwa Ọgọstụ n'afọ 1964), bụ onye ọrụ gọọmentị Naijirịa na onye isi Civil service of the federation, kemgbe ụbọchị iri abụọ na asatọ n'ọnwarị n'afọ 2020.[1] Onye isi ala Naịjirịa, Muhammadu Buhari ṅụrụ iyi na 4 Machị 2020.[2]
A mụrụ Yemi-Esan na Kaduna Steeti, Naijirịa. Ọ si Ikoyi, Ijumu, Kogi State. Ọ gụrụ akwụkwọ praịmarị na Bishop Smith School, Ilorin ma gaa Federal Government College, Ilorin maka agụmakwụkwọ ụlọ akwụkwọ sekọndrị ya. Ọ gara Mahadum nke Ibadan, ebe ọ gụsịrị akwụkwọ na 1987 dị ka nwa akwụkwọ kachasị mma maka ịwa ezé. O mechara nweta asambodo na atụmatụ ahụike na njikwa, tupu ọ nweta nzere masta na nchịkwa ọha na eze na nke mba ụwa.[3]
Yemi-Esan malitere ọrụ ya na Federal Ministry of Health na Naijirịa, tupu e bulie ya n'ọkwa onye nduzi. N'oge ọ nọ na ngalaba ahụike, ọ rụrụ ọrụ dị ka onye na-ahụ maka mmekọrịta West Africa Health Organisation (WAHO), onye nhazi nke ahụike ọnụ na mmemme ụlọ akwụkwọ na onye nduzi nke nyocha na ọnụ ọgụgụ atụmatụ ahụike.[4][5]
N'afọ 2012, e buliri ya n'ọkwa odeakwụkwọ na-adịgide adịgide nke Federal, na-eje ozi dị ka odeakwụkwọ na na-adịkarị adịgide nke Service Policy and Strategy Office nke Onye isi ọrụ gọọmentị nke gọọmentị etiti, Federal Ministry of Information and Culture, Federal Ministry nke Education na Federal Ministry of Petroleum Resources.[6]
N'abalị iri na asatọ n'ọnwa Septemba n'afọ 2019, onye isi ala Naijirịa, Muhammadu Buhari, họpụtara ya ka ọ bụrụ onye na-anọchite anya onye isi ọrụ gọọmentị nke gọọmentị, na-anọchi Winifred Ekanem Oyo-Ita.[7]
N'abalị iri abụọ na asatọ n'ọnwa Febụwarị afọ 2020, e mere ya onye isi ọrụ gọọmentị na-adịgide adịgide nke gọọmentị etiti ahụ ma ṅụọ iyi n'ọkwa n'ụbọchị anọ n'ọnwokusatu afọ 2020.[8][9]