ụdịekere | nwanyị |
---|---|
mba o sị | Naijiria |
aha enyere | Funke |
aha ezinụlọ ya | Bucknor |
ụbọchị ọmụmụ ya | 27 Jụn 1976 |
Ebe ọmụmụ | Lagos |
Ńnà | Segun Bucknor |
nwanne | Tosyn Bucknor |
Asụsụ obodo | Asụsụ Yoruba |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Bekee, Asụsụ Yoruba, pidgin Naịjirịa |
ọrụ ọ na-arụ | odee akwụkwọ, onye ọka iwu, onye ọchụ̀nta ego |
ebe agụmakwụkwọ | University of Lagos, Nigerian Law School, Ụlọ akwụkwọ Lagos Business School |
Ihe nrite | BBC 100 Women |
Funke Bucknor-Obruthe (a mụrụ n'ụbọchị nke 27 n'ọnwa Juun n'afọ 1976) bụ onye ọchụnta ego na onye ọka iwu Naijiria. Ọ bụ onye hiwere na onye isi oche nke Zapphaire Events ma bụrụ otu n'ime ndị mdụ bidoro ọrụ ị hazi mmemme na Naịjirịa.
Bucknor-Obruthe bu onye a muru nye Segun na Shola Bucknor na Legọs Steeti,na Saụtwestị Naijiria. [1] Ọ malitere agụmakwụkwọ praịmarị na nke sekọndrị na Fountain Nursery and Primary School,nke Legọs, na Nigeria Navy Secondary School,nke Legọs, tupu ọ gaa agụmagụ Iwu na Mahadum nke Legọs . [2] N’afọ 2000, a kpọrọ ya n'ọkwa okaikpe ka ọ gachara Nigerian Law School n'Abuja . [3]
Mgbe ọ rụchara ọrụ ọkaikpe nwa oge, Bucknor-Obruthe nwetere n'ọrụ na Tie Communications, ụlọ ọrụ mgbasa ozi, ebe ọ rụrụ ọrụ nwa oge. N'afọ 2003, ịhụnanya o nwere maka ịhazi ihe omume mere ka o bido Zapphaire Events, ụlọ ọrụ na-ahazi mmemme. [3] Kemgbe ahụ, ọ gara n'ihu ịhazi ọtụtụ ihe omume dị elu n'ime na n'èzí Naijiria ma nweta mmeri na nkwanye ùgwù gụnyere ị bụ ndị egosipụtara na Inside Africa nke CNN maka ịhazi agbamakwụkwọ ndị eze nke Naijiria. [4] Ụfọdụ n'ime ndị a gụnyere onyinye Future Award for "Entrepreneur of the Year" (2006), Wedding Planner Magazine Award for "Wedding Planner of the Year" (2007), Go2girl Life Achievement Awards (2011), Nigerian Events Awards for Outstanding Contribution to the Events Industry (2012). [5]
N’afọ 2014, akwụkwọ nchịkọta ọnlaịnụ nke Naịjirịa a kpọrọ <i id="mwLw">YNaija</i> depụtara Bucknor-Obruthe na “10 Most Powerful Under-40s in Business”. [7] N'afọ 2016, ọ nọ na ndepụta usoro 100 Women ndị BBC . [8]
Bucknor-Obruthe lụrụ Onome Obruthe, onye ya na ya nwere ụmụ abụọ. Ọ bụ nwanne nwanyị nke okenye nke onye mgbasa ozi Naijiria Tosyn Bucknor . [9] [10]