Glynn Llywelyn Isaac (19 Nọvemba 1937 - 5 Ọktoba 1985) bụ onye ọkà mmụta ihe ochie nke South Afrịka bụ onye ọkachamara na akụkọ ihe mere eme nke Africa, ọ bụkwa otu n'ime ụmụ ejima nke ndị ọkà mmụta ihe ọkụkụ William Edwyn Isaac na Frances Margaret Leighton mụrụ. A na-akpọ ya onye Africa kachasị nwee mmetụta na ọkara narị afọ gara aga, a ka na-ekwukwa akwụkwọ ya gbasara mmegharị na omume mmadụ na ọmụmụ ihe otu ụzọ n'ụzọ anọ nke narị afọ ka e mesịrị.[1]
Ọ nwetara akara ugo mmụta mbụ ya na Mahadum Cape Town na 1958 tupu ọ gụọ maka PhD ya na Peterhouse, Cambridge nke ọ gụsịrị na 1969. Ọ bụkwa Warden for Prehistoric Sites na Kenya n'etiti 1961 na 1962 na osote onye nduzi nke Centre for Prehistory and Palaeontology na National Museums of Kenya site na 1963 ruo 1965. Na-arụ ọrụ na Richard Leakey, ọ bụ onye nduzi nke ọrụ Koobi Fora nke East Africa.
N'afọ 1966, ọ sonyeere ngalaba Anthropology na Mahadum California, Berkeley ma n'afọ 1983 a họpụtara ya ka ọ bụrụ Prọfesọ nke Anthropology na Machị Harvard ebe ọ na-emepe ọrụ nyocha ọhụrụ n'oge ọnwụ ya. Ọ bụ ejima ya, Rhys Isaac, onye ọkọ akụkọ ihe mere eme, nke bi na Mahadum La Trobe, hapụrụ ya.
A na-echeta Glynn Isaac nke ọma maka usoro akwụkwọ na echiche nke gbalịrị ijikọta ihe ndekọ ihe ochie dịnụ na ihe nlereanya nke omume mmadụ na ọrụ mmadụ site n'echiche nke evolushọn.[1] Na mbido afọ 1970, Isaac bipụtara banyere mmetụta nke netwọk mmekọrịta, nchịkọta, iri anụ na ihe ndị ọzọ gbasara evolushọn mmadụ, ma tụọ aro usoro ihe nlereanya iji nyochaa otu ìgwè mmadụ na paleolithic ga-esi tinye aka n'inweta ihe ndị dị mkpa nke ndụ, na imekọrịta ihe. Ihe nlereanya Isaac lekwasịrị anya na "ụlọ" na mkpa nkewa mmekọahụ nke ọrụ na nhazi mmekọrịta mmadụ na ibe ya.