ụdịekere | nwanyị |
---|---|
mba o sị | Obodoézè Nà Ofú |
aha enyere | Helen |
ụbọchị ọmụmụ ya | 10 Disemba 1984 |
Ebe ọmụmụ | Ibadan |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Bekee |
Asụsụ ọ na-ede | Bekee |
ọrụ ọ na-arụ | odee akwụkwọ |
ụdị ọrụ ya | literature written by women |
ebe agụmakwụkwọ | Corpus Christi College, The Cardinal Vaughan Memorial RC School |
agbụrụ | Ndi Yoruba |
Onye òtù nke | Royal Society of Literature |
Ihe nrite | Fellow of the Royal Society of Literature, Somerset Maugham Award |
nnọchiaha nkeonwe | L484 |
Helen Olajumoke Oyeyemi (a mụrụ n'abalị iri n'ọnwa nke iri na abụọ (Disemba) n'afọ 1984) bụ onye ojii,nke Briten bụ onye ode akwụkwọ na-ede akwụkwọ nkpirikpi. Kemgbe afọ 2014 ụlọ ya dị na Prague . [1] [2]
A mụrụ Helen Oyeyemi n'afọ 1984 na Naijiria mana o toro na Lewisham,na Saụt Lọndọn ma nna ya bụ onye nnọchi anya onye nkuzi ma nne na-arụ ọrụ na London Underground. [3] Ọ gụsịrị akwụkwọ na Mahadum nke Cambridge. [4] Ọ bi na Prague ugbu a.
Oyeyemi dere akwụkwọ mbụ ya, The Icarus Girl, mgbe ọ na-agụ akwụkwọ A-level ya [5] na Kadịnal Vaughan Memorial School . Ka ọ na-agụ akwụkwọ sayensị na ndọrọ ndọrọ ọchịchị na Corpus Christi College, Cambridge, Oyeyemi hụrụ egwuregwu abụọ ya, Juniper's Whitening na Victimese, nke ụmụ akwụkwọ ibe ya mere iji too ya, na nke Methuen mechara bipụta.
N'afọ 2007, Bloomsbury bipụtara akwụkwọ nke abụọ nke Oyeyemi, The Opposite House, nke sitere n’akụkọ ọdịnala ndị Kuba . [6] Akwụkwọ nke atọ ya, White Is for Witching, nke akọwapụtara na o nwere "mgbọrọgwụ na Henry James na Edgar Allan Poe ", nke Picador bipụtara n'ọnwa Mee afọ 2009. Akwụkwọ nke anọ, Mr Fox ("ntụgharị uche nke gbasara odide ihe nke jupụtara navignettes nke n'akowa otu asụsụ si atọhapụ ma ọ bụ amachi", Anita Sethi bụ onye dere nke a), [7] bụ Picador bipụtara n'ọnwa Juun afọ 2011, na nke ise, Boy, Snow, Bird, in 2014 . [3]
Oyeyemi bipụtara nchịkọta akụkọ What Is Not Yours Is Not Yours, n'afọ 2016 [8] mana ọrụ ya kachasị ọhụrụ, akwụkwọ akụkọ akpọrọ Gingerbread, ka e bipụtara n'ụbọchị nke ise n'ọnwa Maachị afọ 2019. [9]
Otu n’ime ọtụtụ ihe e dere n’edemede Oyeyemi bụ agbụrụ na ị cha ọcha, ọkachasị na 'Boy, Snow, Bird'. Oyeyemi na-ekwu na ọ metụtara ya site n'akwụkwọ ọ gụrụ na nwata ebe a kọwara ndị isi ojii n'ụzọ nleda anya. [10]
Akwụkwọ akụkọ ya bụ White Is for Witching ruruogo nke ikpeazụ nke Shirley Jackson Award nke afọ 2009 ma[11] wee nweta akara ugo mmụta Somerset Maugham Award nke afọ 2010. [12] N’afọ 2009 ka a mara Oyeyemi dịka otu n’ime ụmụ nwanyị nọ na ndepụta nke “25 under 25” nke Venus Zine . [13] N'afọ 2013, e tinyere ya na ndepụta Granta Best of Young British Novelists . Boy, Snow, Bird ruru agba nke ikpeazụ na Los Angeles Times Book Prize n'afọ 2014. [14] Boy, Snow, Bird nwetara PEN Open Book Award : maka ọrụ akwụkwọ pụrụ iche nke onye edemede nke abụghị onye ọcha e bipụtara n'afọ 2016. [15]
Oyeyemi bụ onye ọka ikpe na Booktrust Independent Foreign Fiction Prize for 2015, [16] wee rụọ ọrụ ka onye ọka ikpe maka 2015 Scotiabank Giller Nrite . [17]
A họpụtakwara Oyeyemi ka ọ bụrụ onye otu ndị Royal Society of Literature n'afọ 2013. [18]