ụdịekere | nwanyị |
---|---|
mba o sị | South Africa |
aha enyere | Hester |
ụbọchị ọmụmụ ya | 1915, 18 Septemba 1915 |
Ebe ọmụmụ | Kroonstad |
Ụbọchị ọnwụ ya | 1996, 22 Disemba 1996 |
Dị/nwunye | William Empson |
nwa | Jacobus Arthur Calais Empson, [William Hendrick] Mogador Empson |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Bekee |
ọrụ ọ na-arụ | onye na-akpụ ihe ọkpụkpụ, activist, onye ese |
ụdị ọrụ ya | art of sculpture |
ebe agụmakwụkwọ | University of the Free State |
ikike nwebiisinka dị ka onye okike | Ọrụ nwebiisinka chekwara |
Hester Henrietta (Hetta) Crouse Empson (afọ 1915 rụọ afọ 1996) bụ onye South Africa na-akpụ ihe. A kọwara ya dị ka "onye na-ese ihe, onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị, onye na-eme njem na onye na-elekọta mmadụ" na akụkọ ọnwụ ya na Times .[1] Ya na di ya William Empson sonyere na otu London bohemian nke gụnyekwara George Orwell, Louis MacNeice, Jill Neville, Fay Weldon, Lewis Wolpert na Kathleen Raine.[2]
A mụrụ Crouse na Kroonstad, South Africa n'ubochí iri na asatọ n'ọnwa Septemba n'afọ 1915.[1][3] Ọ gara Mahadum Bloemfontein ma gụọ nka na Germany.[1]
Ọ laghachiri South Africa ebe ọ rụrụ ọrụ na akwụkwọ akụkọ. Crouse laghachiri Europe ya na onye ọlụlụ ya n'oge ahụ bụ Rene Graetz [de]. Ógè ọ gara mbà France na Switzerland, ọ gara n'ihu, n'onwe ya gaa England. Ọ nọrọ n'ebe ahụ n'oge Agha Ụwa nke Abụọ, na-arụ ọrụ dị ka onye ọkwọ ụgbọ oloko wee na British Broadcasting Corporation (BBC). Na BBC, ọ zutere di ya n'ọdịnihu bụ William Empson, onye nkatọ edemede, onye ya na ya nwere ụmụ nwoke abụọ.[1]
Di na nwunye ahụ lụrụ ma kwaga China n'afọ 1947. Ha nọrọ ebe ahụ ruo afọ 1952, ógè ha laghachiri England. William Empson kwagara Sheffield iji kụziere Bekee na Mahadum Sheffield ebe Hetta Empson bi na London.[1]
N'afọ 1956, ọ mụrụ nwa nwoke nke atọ ya na onye ọ hụrụ n'anya, onye na-ede uri bụ Peter Duval Smith .[1][2]
N'afọ 1979, e mere William Empson onye isi ma Hetta ghọrọ Lady Empson.[1] Ọ nwụrụ n'ubochí irí abụọ na abụọ n'ọnwa Disemba n'afọ 1996.[3]
<ref>
tag; name "ArchivesHub" defined multiple times with different content
<ref>
tag; name "Observer" defined multiple times with different content
<ref>
tag; name "RKD" defined multiple times with different content