ụdịekere | nwoke |
---|---|
mba o sị | Naijiria |
aha n'asụsụ obodo | Ifeanyi Arthur Okowa |
Aha ọmụmụ | Ifeanyi Arthur Okowa |
aha enyere | Arthur |
ụbọchị ọmụmụ ya | 8 Julaị 1959 |
Ebe ọmụmụ | Ȯra Delta |
Asụsụ obodo | Asụ̀sụ̀ Ìgbò |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Bekee, pidgin Naịjirịa |
Asụsụ ọ na-ede | Bekee |
ọrụ ọ na-arụ | Onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị |
Ọkwá o ji | onye otu ndi omeiwu nigeria, Governor of Delta State |
ebe agụmakwụkwọ | University of Ibadan, Edo College |
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị | People's Democratic Party |
agbụrụ | Ndị Igbo |
Ụcha ime anya | brown |
ụcha ntụtụ isi | Ntụtụ ojii |
nnọchiaha nkeonwe | L485 |
Arthur Okowa (amụrụ ya n'abali asatọ nke ọnwa Julai afọ 1959) bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ala Naijiria Ọ bụ Gọvanọ nke Steeti Delta. E duruya n'iyi ọrụ dika gọvanọ n'abali iri abụọ na itolu nke ọnwa Mee afọ 2015 ka o merisịrị na ntuli aka nke steeti emere n'ọnwa Eprel afọ 2015. Tupu ọkwa gọvanọ ya, a hoputara ya onye nnọchite anya maka Delta North Senatorial District na Steeti Delta, Naijiria, na nhoputa ndi ochichi nke emere n'ọnwa Eprel 2011. Ọ doro ọkwa ọchichia site na otu ndị People's Democratic Party (PDP). Ọ bụ onye Ika si Owa-Alero na Steeti Delta, Naijiria. Ọ bụkwa onye mbụ si Anioma rutere ọkwa gọvanọ nke Steeti Delta . A hoputakwara ya ọzọ dika onye ochichi nke Delta State n'abali iri abụọ na itolu nke ọnwa Mee, afọ 2019.
A mụrụ Okowa na Owa-Alero na Ika North-East Local Government Area nke Steeti Delta. Ọ gara Edo College, nke dị na Benin City (n'agbata afọ 1970–1976), wee gawa Mahadum nke Ibadan ebe ọ gụrụ maka inye ọgwụ na ịwa ahụ, Ọ gụsịrị akwụkwọ na afọ 1981 na ogo MBBS. Mgbe ọ hapụsịrị National Corps Service Corps, ọ rụrụ ọrụ na Ụlọ ọrụ na elekọta njikwa nke ụlọ ọgwụ ndị dị na Steeti Bendel dị ka onye ọrụ ahụike. Ọ banyere ọrụ onwe onye dị ka Director, na Victory Medical Center, Igbanke na afọ 1986. [1]
Okowa ghọrọ onye ode akwụkwọ nke mpaghara Gọọmentị Ika ma mechaa bụrụ onye isi oche nke Ika North-East Local Government Council (na agbata afọ 1991–1993). Ọ bụ onye nhakọta Delta North nke Grassroots Democratic Movement (GDM). Ọ banyere PDP na afọ 1998, ma nye aka na mkpọsa Gọvanọ James Ibori na afọ 1998/1999. Ọ rụrụ ọrụ dị ka Onye Kọmishọna na gọọmentị Steeti Delta maka Ọrụ Ugbo na Ihe ana enweta n'ala (site n'ọnwa Julai afọ 1999 - rue ọnwa Eprel afọ 2001), nke mmepe ihe gbasara mmiri (n'ọnwa Eprel afọ 2001 - rue ọnwa May afọ 2003) na nke ahu ike (n'ọnwa Septemba afọ 2003 rue ọnwa Oktoba afọ 2006). [2]
Okowa gbara arụkwaghịm ịzọ ọkwa ntuli aka nke ọkwa Onye nnochite anya otu pati PDP na ọkwa ọchichi gọvanọ Delta Steeti nke afọ 2007, mana o riteghị ọkwa Onye nnochite anya otu ahu maka gọvanọ na ntuli aka emere. [3] N’ọnwa Juunu afọ 2007, a họpụtara Ifeanyi ka ọ bụrụ Ode akwụkwọ nke Gọọmentị Steeti Delta. [4]
A họpụtara Ifeanyi ka ọ bụrụ onye ndoro ndoro na anọchite anya mpaghara ọdida anyanwu nke Delta na ụlọ nzukọ Senate na ntuli aka nke otu pati PDP emere n'ọnwa Jenụwarị afọ 2011, ọ nwetere vootu nari itolu iri anọ na abụọ, mana a gbara mmeri a ụkwụ site n'aka ndị isi pati ndị chọro Marian Amaka Alli dịka onye ndoro ndoro ga anochite anya ha. [5] A họputara ya ọzọ na ntuli aka emeghariri ebe o nwetara vootu otu puku nari anọ iri anọ na isii, megide vootu otu nari na asatọ aturu maka Dọkịnta Marian Alli. [6] Na ntuli aka nke ọnwa Eprel afọ 2011 maka oche onye nnọchite anya mpaghara ọdida anyanwu Delta na ụlọ nzụkọ Senate, Ifeanyi nwetara vootu puku iri itolu na asatọ otu nari na iri anọ, karịa onye nke abụọ bụ, Prince Ned Munir Nwoko nke Democratic People's Party, onye nke nwetara vootu puku iri isii na asaa nari itolu na iri asatọ na ise. [7] E kwuru na esemokwu ka dị banyere ntuli aka ahụ emere na ọnwa Jenụwarị afọ 2013. [8] N'ikpeazụ, Ifeanyi nwetara akara ntuli aka maka ọkwa gọvanọ na afọ 2015 n'okpuru pati PDP ọ nwetere vootu Nari anọ na isii n'abali asatọ nke ọnwa Disemba afọ 2014. [9] O meriri ntuli aka nke oche ọchichi govanọ Steeti Delta na afọ 2015 n'ọnwa Eprel afọ 2015 site na i nweta vootu dị nari puku asaa iri abụọ na anọ na nari isii na iri asatọ. [10] E duru ya n'iyi ọrụ dika Gọvanọ n'abali iri abụọ na itolu nke ọnwa Mee afọ 2015 kemgbe ahụ ọ malitela ọrụ dị egwu. Na nhoputa ndi ochichi govanọ nke emere n'abali itolu nke ọnwa March, afọ 2019, Okowa, onye bụ onye otu ndi Peoples Democratic Party, nwetara vootu Nari puku itolu iri abụọ na ise na nari abụọ iri asaa na anọ iji merie onye ya na ya doro, bụ onye ndoro ndoro ochichi All-Progressive Congress, Great Ogboru, onye nwetara vootu Nari puku abụọ iri na ise na nari itolu iri atọ na asatọ. [11]
N'ụbọchị 16 nke ọnwa Juun, 2022 bụ Atiku Abubakar bụ onye na-azọ ọkwa onyeisiala nke Peoples Democratic Party ka ọ bụrụ onye ga-eso ya na ntuliaka 2023.[12]