The Evangelical Climate Initiative (ECI) bụ mkpọsa nkè ndị isi ụka nà òtù US-American na-akwalite usoro ahịa iji wéé belata okpomọkụ ụwa.
Ókwú ECI, na-akpọ màkà ichebe ụwa pụọ na okpomọkụ ụwa, mmetọ, mkpochapụ.[1]
The Evangelical Climate Initiative malitere n'ọnwa Febụwarị n'afọ 2006 site na National Association of Evangelicals.[2] NAE na-arụkọ ọrụ na Center for Health and the Global Environment na Harvard Medical School iji mee ka ndị ọkà mmụta sayensị na ndị isi Ndị Kraịst na-ekwusa ozi ọma gbakọọ aka iji belata mgbanwe ihu ígwé.[3]
Ọ bụ ndị isi ozi ọma iri asatọ na isii na ndị isi nke kọleji ozi ọma irí atọ na itoolu bịanyere áká na ya.[4][5][6] Ọnụ ọgụgụ ndị bịanyere aka arịgoola ihe karịrị otu narị ka ọ na-erule ọnwa Disemba 2007, ma ka ọ na na-erula ọnwa Julaị 2011 ihe karịrị ndị isi narị abụọ na iri abụọ nke ndị bishọp bịanyere aha n'ọkpụkpọ ahụ.[7][8] David P. Gushee, prọfesọ nke ụkpụrụ omume Ndị Kraịst na Mahadum Mercer, nyèrè aka dee akwụkwọ ahụ.[9]