ụdịekere | nwanyị ![]() |
---|---|
mba o sị | Obodoézè Nà Ofú ![]() |
aha enyere | Ijeoma ![]() |
aha ezinụlọ ya | Uchegbu ![]() |
ụbọchị ọmụmụ ya | 16 Ọgọọst 1960 ![]() |
Ebe ọmụmụ | London ![]() |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Bekee ![]() |
ọrụ ọ na-arụ | pharmacologist, science communicator, researcher ![]() |
onye were ọrụ | University of Strathclyde, University College London ![]() |
ebe agụmakwụkwọ | University of London, University of Benin, University of Lagos ![]() |
onye ndụmọdụ doctoral | Alexander Florence ![]() |
Onye òtù nke | African Academy of Sciences, Black Female Professors Forum ![]() |
Ihe nrite | Fellow of the Controlled Release Society, Fellow of the African Academy of Sciences ![]() |
webụsaịtị | http://www.nanomerics.com, http://iris.ucl.ac.uk/iris/browse/profile?upi=IFUCH91 ![]() |
Ijeoma Uchegbu Audio bụ ọkaçha nmụta nke ndị mepụta ọgwụ na Mahadum London ebe ọ jidekwa ọkwa Pro-Vice Provost maka mpaghara Africa na Middle East. Ọ bụ onye isi ọrụ nke gbasara sayensi nke ngalaba Nanomerics, na ụlọ ọrụ ọgwụ na ahụta maka nanotechnology. Ndị ụlọ ọrụ na ahụta maka ụzọ nnweta ọgwụ maka ọgwụ na-adịghị agbarị na mmiri ka esị tuo anya, acidị nke nucleic na peptides. Ewezuga ka esi akpọ aha ya aghara aghara na edemede maka nyocha sayensị na Pharmaceutical Nanoscience, [1] amakwara Uchegbu maka ọrụ ya na ihe gbasara ikwụ pụta okwụ maka njikọta sayensị na igwe nmadu, ya na ịwezụga ikpa oke na ina ba'ta ndi di iche iche na Sayensi, Teknụzụ, Injinia na mgbakọ na mwepụ (STEM). [2] [3]
Uchegbu toro na Hackney ya na ndịda ọwụwa anyanwụ Nigeria.[4] Ọ gụrụ maka ịmeputa ọgwụ na Mahadum Benin, gụsịrị akwụkwọ na afọ 1981, wee nweta akara ugo mmụta, nzere masta ya na Mahadum Lagos . [5] Onweghi ike inweta asambodo nke ka chi si (PhD) na Nigeria n'ihi na akarangwa nke ahụ adighị. [6] Ọ laghachiri UK ma gụchaa akwụkwọ mahadum ya na Mahadum London, gụsịrị akwụkwọ wee nweta re masta ya na Mahadum Lagos . [5] Onweghi ike inweta asambodo nke ka chi si (PhD) na afọ 1997. Ọ bụ Alexander (Sandy) Florence, onyeisi nke ngalaba akwụkwọ imepụta ọgwụ hụkwara ma nyochaa ya maka akara ugo mmụta. A họpụtara ya maka ịbụ onye nkuzi na Mahadum Strathclyde site na afọ 2002 rue 2004.
Uchegbu bụ onye isi oche na nnweta ọgwụ na Mahadum Strathclyde na afọ 2002. N'ebe a ọ rụrụ ọrụ na nzuko na ichikọ polymer, nke bu ihe ndị nwere ike ịnye aka wepụta nanosystem ụdị kwụsie ike. [7] O gosiputara na enwere ike iji ihe omuma nke polymer jikwaa oke nke vesicles. Ọ sonyeere Mahadum University London na afọ 2006 dị ka onye isi oche na gwọọ ọgwụ Nanoscience na ngalaba ụlọ akwụkwọ ahu maka imeputa Ọgwụ. Uchegbu na-edu ndị otu na nyocha maka nke molecular design na usoro inu ọgwụ dị ka nke a. [8] O meela polymers nke na-ejikọta onwe ya n'ime nanoparticles site na iji ihe kwesịrị ekwesị iji bufee ọgwụ na ahụ nmadu. Ọ na-achọpụta otú enwere ike iji ma were nanoparticles nnyefe ọgwụ. Uchegbu ji kwa ọtụtụ ikikere (patenti) maka ịnye ọgwụ ọgwụ, [9] [10] [11] [12] [13] [14] [15] [16] na ndị na-ekekọta ọgwụ polymers. [17] [18] [19] Ọgwụ ya na- ebunye mkpụrụ ndụ ihe nketa na siRNA na etuto di iche iche na'ime ahụ na peptides na ụbụrụ. Ọgwụ ya na egosi igba ume na nnabata ọgwụ hydrophobic site na iji nanoparticles. [20] Ọ na-etinye anya na nchọpụta etu aga esi nwe ike jiri ọgwụ ndia na emeputa gwọọ ọrịa akpụ ụbụrụ. Na afọ 2018 ọ so na ndi nke wetatra nde pounds (£5.7) Injinia na Nchọpụta Ahụ́ Ike granti maka, Raman Nano theranostics, nke ga-eji nanoparticles ọla edo chọpụta ọrịa na ọkụ iji bibie mkpụrụ ndụ ndị ọrịa. [21] Ọ na ejikwa nanoparticles magnetik arụkwa ọrụ ya. .
Na afọ 2010 Uchegbu na Andreas Schtzlein tọrọ ntọala Nanomerics. [22] Nanomeriki bụ ụlọ ọrụ ọgwụ na-eji nanotechnology mepụta ọgwụ. Uchegbu bụ onye isi sayensị nke ụlọ ọrụ Nanomerik.[7] Nanomerics bu ihe ndi puru ime njem nke nwere ike ibufe ihe na alụ agha megidi ọrịa na ahu nmadu na enweghi ngbochi obula na obara ma'ọbụ na ubụrụ. [23] Nanomerics na - emepụta teknụzụ ngwakọ ụmụ irighiri ihe na - eme site na amphiphilic polymers nke na - ejikọ onwe ha. [24] Na afọ 2017 ọ meriri na asọ mpi nke Royal Society of Chemistry maka Teknụzụ ohuru maka ụmụ irighiri ihe ha arụ na ngalaba molecular envelope. [25] O were ikike (patentị ) NM133 nyefe ndị olu nmeputa ọgwụ Lacta na afọ 2017. NM133 nwere cyclosporine A ma enwere ike iji gwọọ ọria maka anya kọrọ mmiri.
Uchegbu na-arụ kwa ọrụ di ka oso ndi nchikota akwụkwọ nke Journal of Controlled Release . [26] Ọ rụrụ ọrụ dị ka odeakwụkwọ sayensị nke ndi otu Controlled Release. Ọ bụ onye nchịkọta-isi nke ọgwụ Nanotechnology. [27] O no na otu ndumodu banyere ahu ike ulo ogwu nke nchoputa injinia . O tinyere aka na mmemme Mahadum London mee're maka National Health Service jiri gbaa afọ iri asaa. [28] N'afọ 2007 ka aghọrọ ya maka Mmepụta nke Mmezu Pụrụ Iche nke SET nke gosipụtara na Museum nke Sayensi na British Museum . [29]
N’afọ 2015, a họpụtara Uchegbu ịbụ Pro-Vice Provost maka Africa na Middle East. [30] [31] Ọ na-ahụ maka ngalaba netwọkụ mpaghara Afrịka na Middle East na Mahadum College London. Ọ na-ewu mmekọrịta na ịmalite emekọ ihe ọnụ, na-anabata kwa ndị ọbịa mba ụwa ma na-akwado inabata ụmụ akwụkwọ. [32]
Uchegbu na esonye na njikọta ọha na nkwukọrịta sayensị nke a'na egosipụta na onyonyo na BBC nke an'na akpo Oge Nwanyị nke BBC ebe ọna anọ atụle nyocha ya banyere etu a ga-esi jiri ụmụ irighiri Nano nyeka iji nyefee ọgwụ na ahụ ka odi ire[33] O sonye kwa na mmeme Soapbox Science nke na ebulite sayensị nke mba ụwa ni'le ma'na akwalite ụmụ nwanyị sayensị na ọrụ ha na-arụrụ. [6]
Uchegbu tinye kwara aka na ihe banyere nha nha kwu'ọtọ na mmemme gbasara ina ba'ta ndi di iche iche. Ọ na-arụ ọrụ dị ka onye nnọchi anya UCL Provost maka Race Equality [3] ma gosipụta onwe ya dị ka onye otu Black British Role Model maka Ndị Injin Inyom . [2] Ọ na-arụkwa ọrụ na kọleji Mahadum London Race Equality Charter nyocha onwe. [34] [35] O so na ndi otu ndi nkuzi oka cha nmuta ndi Black Female. [36] [37]