ụdịekere | nwanyị |
---|---|
mba o sị | South Africa |
aha enyere | Irene |
aha ezinụlọ ya | Charnley |
ụbọchị ọmụmụ ya | 6 Mee 1960 |
Ebe ọmụmụ | South Africa |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Bekee |
ọrụ ọ na-arụ | onye ọchụnta ego |
Charnley bu ụzọ mee akara ya na ngalaba ndị azụmaahịa Afrịka site n'Ị bụ onye bụ ọnọnetiti na-ekwuchita okwu maka National Union of Mineworkers nke South Africa ebe ọ nọrọ afọ iri na atọ na-ahazi ngalaba dị iche iche nke ọrụ ndị otu ahụ.[1][2] Ọ gara n'ihu bụrụ onye isi nchịkwa nke ụlọ ọrụ nnukwu bu MTN in nke bụ ụlọ ọrụ nkwukọrịta kachasị ukwuu n'Africa.N'okpuru idu ndú ya, ọtụtụ mba Afrịka na Middle East (gụnyere Naịjirịa na Iran) jikọtara n'okpuru ikukunetwọk MTN.[1] Charnley bụ onye guzobere National Empowerment Consortium nke mejupụtara 50% ndị nwe ụlọ ọrụ ojii na 50% ndị ọrụ ojii Africa.[2] Ha mechara nwee 35% nke Johnnic Holdings (nke a na-akpọ Johnnic Communications ugbu a).[2]
Charnley hapụrụ MTN na ọnọdụ esemokwu mana O nweruru ṅdè dọla otu narị na iri ise mgbe ọ n'apụ.[1] N'ọnwa Ọgọstụ afọ 2000, e nyere ya nturu ugo onye ọchụnta ego nke Afọ ahụ maka enyemaka dị ịrịba ama o nyere iji wegota Johnnic site n'obere ụlọ ọrụ mmepụta ihe gaa n'òtù mgbasa ozi nkwukọrịta nke dị n'ụdị mgbe ahụ.[2] N'oge ọ nọ na Johnnic (site na 1996 ruo na ngwụcha afọ 2000) ndị mba South Africa dị puku iri atọ na abụọ n'ọnụ ọgụ na-enweghị ihe ọ bụla zụụrụ òkè(shares) na ụlọ ọrụ ahụ.[2] Òtútó ego ndi a ka afọ atọ gasịrị meziri ka ha bụrụ ndị nwetakwara ego ha òkpùkpù anọ karịa ka ha si tinye ya.[3] Ihe nturu ugo ọzọ mere ka Charnley bụrụ otu n'ime ụmụ nwanyị ọchụnta ego iri ise mbụ kachasị elu ma apụọ na mba America.[2]
Charnley bụ onye isi oche nke Smile Telecoms Holdings Ltd ugbu a, otu ụlọ ọrụ zuru mba Afrika ọnụ nke isi ụlọ ọrụ ha dị na Mauritius, ma ha nọ ọrụ na Naijiria, Tanzania, Uganda, Democratic Republic of the Congo na South Africa.[1]
Forbes debara aha ya n'etiti "Ndị inyom iri ise kachasị ike n'Africa" n'afọ 2020.[4]