ụdịekere | nwanyị |
---|---|
mba o sị | Naijiria |
obodo maka egwuregwu | Naijiria |
aha enyere | Josephine |
ụbọchị ọmụmụ ya | 19 Maachị 1992 |
Ebe ọmụmụ | Anambara Steeti |
ọrụ ọ na-arụ | Onye otu egwuregwu bọọlụ |
ọnọdụ egwu na otu / ọpụrụiche | onye na-agbachitere |
onye nsonye òtù egwuregwu | Rivers Angels F.C., Washington Spirit, Nigeria women's national under-20 football team, Nigeria women's national football team, Vittsjö GIK |
ụdị egwuregwu | footbọl |
Templeeti:Infobox football biography
Josephine Chiwendu Chukwunonye (amụrụ 19 Maachị 1992) bụ onye egwuregwu bọọlụ Naịjirịa na-agba Kungsbacka na Damallsvenskan na maka otu egwuregwu bọọlụ ụmụ nwanyị Naịjirịa . Ọ gbaburu bọọlụ na mpaghara Rivers Angels afọ asaa na Washington Spirit na Otu Egwuriegwu boolu Nke Umunwaanyi.
Ka ọ gbachara afọ asaa na Rivers Angels n'asọmpị ụmụnwaanyị Naịjirịa, n'ọnwa Jun afọ 2015 ka a mara ọkwa na Chukwunonye ga-esonye na otu Egwuriegwu boolu Nke Umunwaanyi Washington Spirit . A bịanyere aka na ya n'otu oge ahụ Hayley Raso mba Australia, na ọkwa ahụ na-abịa ụbọchị tupu otu egwuregwu bọọlụ ụmụ nwanyị Naịjirịa gbagoro Australia na asọmpi iko mba ụwa nke FIFA 2015 . Chukwunonye kwuru n'oge ahụ, "Obi dị m ụtọ isonye na ezinụlọ Washington Spirit; ọ bụ ihe ọṅụ na nrọ mezuru m, ọ na-amasị m iso nnukwu ndị egwuregwu dịka Crystal Dunn, bụ onye m zutere n'asọmpi U20 World Cup na 2012. . Obi dị m ụtọ iso onye nchịkwa Parsons rụkọọ ọrụ n'ihi na amaara m na ọ ga-ewepụta ihe kacha mma n'ime m." Chukwunonye bụ onye mba Naịjirịa nke abụọ na squad, sonyere Francisca Ordega . [1] [2] Mgbe ọ gbasịrị egwuregwu abụọ maka otu ahụ, a tọhapụrụ ya na Disemba 2015. [3]
Na March 2016, ma Chukwynonye na onye mba Naijiria ibe ya bụ Ngozi Okobi bụ ndị otu Sweden Vittsjö GIK bịanyere aka na ya. Ha na-agbakọbu ọnụ na squad nke Washington Spirit, na mgbe ha na-akwaga Vittsjö GIK, ha na ndị mba Naijiria abụọ ọzọ sonyeere, Nkem Ezurike na Ifeoma Dieke . Chukwynonye kwuru "Obi dị m ụtọ ịbanye na ezinụlọ Vittsjo; ọ bụ ihe ọṅụ na nrọ mezuru m, ọ na-agụsi m agụụ ike igosi onwe m ma nyekwa ike m niile iji kwalite klọb ahụ n'ebube". [4]
Chukwunonye nọchitere anya Naijiria n'ọkwa ndị obere na asọmpi iko mba ụwa nke FIFA U-17 na 2012 FIFA U-20. N'ọkwa dị elu ọ so na ndị otu Naijiria na asọmpi iko mba ụwa nke FIFA nke 2011 na 2015 yana asọmpi ụmụ nwanyị Africa na mbipụta 2010, 2012 na 2014, merie asọmpi ahụ ugboro abụọ ( 2010 na 2014 ). [5]