ụdịekere | nwanyị ![]() |
---|---|
mba o sị | South Africa, Namibia ![]() |
Aha ọmụmụ | Juanita Naudé ![]() |
aha enyere | Juanita ![]() |
ụbọchị ọmụmụ ya | 26 Eprel 1972 ![]() |
Ebe ọmụmụ | Windhoek ![]() |
nwa | Franja du Plessis, Ruan Josh ![]() |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Bekee, Afrikaans language, German ![]() |
ọrụ ọ na-arụ | onye na-abụ abụ ![]() |
oge ọrụ ya (mmalite) | 1998 ![]() |
ngwa egwu | olu egwụ ![]() |
ebe e guzobere | Namibia ![]() |
ụdị | Jennifer Hudson ![]() |
Juanita du Plessis (née Naudé) bụ onye na-agụ egwu mba Afrikaans, a mụrụ n'abalị iri abụọ na isii nke ọnwa Eprel na Windhoek, Namibia . A maara ya maka egwu ya bu Ska-Rumba . Ọrụ ịbụ abụ Du Plessis malitere n'afọ1998 na abọm mbụ ya bụ Juanita . N'afọ ahụ, o ritere ihe nrite CMA (Country Music Association in Namibia) dị ka onye ọbụ abụ kachasị mma, onye na-ede egwu kachasị mma na awọd nke Association maka ihe ịga nke ọma.
Nrepu Ahịa ndekọ ya karịrị puku atọ.[1] N'afọ 2010, ọ natara ihe nrite South African Music na ngalaba Best Afrikaans DVD nke emume anuri afọ iri ya imepụta egwu kpọrọ ọkụ . DVD ahụ nwere egwu ya kachasị nwee ihe ịga nke ọma n'ime afọ iri mbụ nke ọrụ abụ ya. E tụnyere ya ugo onye kachasị ewu ewu na afọ nke asaa n'usoro na mmemme Huisgenoot's Tempo Awards na Johannesburg n'afọ 2011.[2] N'afọ 2018, o mere emume afọ iri abụọ na ụlọ ọrụ egwu, na-ewepụta abọm kachasị nke 20 Jaar - Treffers van 2008–2018 .
Ọtụtụ abọm dị n'asusuAfrikaans ma a na-edebe aha ndị a n'asụsụ mbụ.
Juanita lụrụ Herman du Plessis ma ha mụtara ụmụ atọ bụ: Ruan, Mario na Franja (abụọ ikpeazụ bụ ejima). Nwanne ya nwoke, Pieter Naudé, bụkwa onye na-eme ihe omume na South Africa. Nwa ya nwoke nke mbụ bụ Ruan bụkwa onye na-agụ egwu Afrikaans, na onye njikwa na Juanita Records. Ọ na-eme ihe nkiri nke oji aha Ruan Josh. Nanị otu nwa ya nwanyị bụ Franja bụkwa onye na-agụ egwu Afrikaans nke ọma ma rite onyinye Ghoema abụọ n'afọ 2017.