Ụlọ ọrụ mmepụta ihe | ahụike ![]() |
---|---|
Oge/afọ mmalite | 27 Mee 1967 ![]() |
aha gọọmenti | Lagos state ministry of health ![]() |
asụsụ njieme | British English ![]() |
mba/obodo | Naijiria ![]() |
dị na ngalaba nhazi mpaghara | Lagos ![]() |
nhazi ọnọdụ | 6°37′10″N 3°21′37″E ![]() |
Nwe ikike | Lagos ![]() |
nwere enyemaka | Lagos State Health Service Commission, Lagos state health management agency, Lagos State Health Facilities Monitoring and Accreditation Agency, Lagos State Blood Transfusion Service ![]() |
ọdịdị isi ụlọ ọrụ | Ikeja ![]() |
Onye nyefere ọrụ | Akin Abayomi ![]() |
street address | State Government Secretariat, Alausa, Lagos State, Nigeria ![]() |
Akara ekwentị | +234-1-4969061 ![]() |
email address | mailto:datainfo@lagosstate.gov.ng ![]() |
webụsaịtị | https://health.lagosstate.gov.ng/ ![]() |
Ngalaba ahụike nke Lagos steeti (Naịjịria) bụ ụlọ ọrụ gọọmentị steeti, nke na-ahụ maka ịhazi na tinye n'ọrụ iwu steeti gbasara ahụike.[1][2]Ministri ahụike nke steeti na njikọ aka na Ụlọ Nzukọ nke steeti Lagos mepụtara iwu usoro ahụike nke Lagos nke guzobere ụlọ ọrụ na-ahụ maka ahụike nke dị na steeti Lagos, usoro ahụike Lagos na ego ahụike nke gọọmentị Lagos.[3][4]
Ụlọ omeiwu nke Lagos steeti mere ka usoro ahụike nke Lagos (LSHS) bụrụ iwu na Mee 2015.[5]Atụmatụ a bụ atụmatụ mkpuchi ahụike nke Gọọmentị Steeti Lagos nke ebumnuche ya bụ inweta ọrụ nlekọta ahụike dị ọnụ ala, zuru oke na nke a na-egbochighị egbochi maka ndị niile bi na steeti Lagos.[6][7]A makwaara atụmatụ mkpuchi ahụike nke Lagos dị ka "ILERA EKO" ebe ọ bụ ụlọ ọrụ Lagos State Health Management Agency na-achịkwa ma na-achịkọta ya.[8][9][3]
Ụlọ ọrụ na-ahụ maka ahụike nke steeti Lagos bụ ụlọ ọrụ nke gọọmentị steeti Lagos nke iwu nyere ikike ilekọta, ịchịkwa, ma hazie atụmatụ ahụike nke Lagos State.[9] Ebumnuche nke ụlọ ọrụ ahụ bụ "inweta Universal Health Coverage" maka mmadụ niile nọ na Lagos State.[10] Ụlọ ọrụ ahụ na-ahụ na ndị debanyere aha na atụmatụ ahụ nwere ike ịnweta ọrụ ahụike dịka "nkwurịta okwu, ọgwụgwọ nke ọrịa dịka ịba, ọbara mgbali elu, ọrịa shuga, ọrụ atụmatụ ezinụlọ, nlekọta ezé, ultrasound scan, nyocha radiological, ọrụ ọdịmma ụmụaka, nlekọta ọrịa ụmụaka, ọrụ nwa ọhụrụ, nlekọta ụmụ nwanyị tupu ọmụmụ na inye nwa".[11][12]
Ọkà mmụta Akin Abayomi[13]
Gọọmentị steeti Lagos pụtara dị ka Gọọmentụ steeti kachasị lebara nsogbu COVID-19 n'afọ na Nigerian Healthcare Excellence Award 2021, n'ihi na gọọmentị steet na ụlọ ọrụ ahụike steeti Lagos meghachiri omume nke dị irè maka ntiwapụ nke COVID-19.[14][15][16]