Leila Alaoui (onwa10 Julaị n'afọ 1982 rụọ onwa 18 Jenụwarị n'afọ 2016) bụ onye obodo France-Moroccan n'ese foto na onye n'ese vidio. [1] [2][3] Ọ rụrụ ọrụ dị ka onye n'ese foto azụmahịa maka magazin na Òtù ndị na-abụghị nke gọọmentị ma rụchaa ọrụ na ndị gbara ọsọ ndụ. E gosipụtara ọrụ ya n'ọtụtụ ebe ma debe ya na nchịkọta nke Qatar Museums. Alaoui nwụrụ site na mmerụ ahụ o nwere na mbàOuagadougou, Burkina Faso.[4]
A mụrụ Alaoui na Paris n'aka nna Moroccan na nne French, ọ toro na mbà Marrakech, n'obodo Morocco.[4] N'oge ọ bụ nwata na n'oge uto ya, ọ n'ahụkarị akụkọ ọjọọ banyere ndị n'akwaga mba ọzọ n'anwụ n'oké osimiri mgbe ha n'eme njem dị ize ndụ, nke ọ kọwara dị ka akụkọ nke ikpe n'ezighị ezi.[5] Mgbe Alaoui gbara afọ iri na asatọ, ọ kwagara Obodo New York City iji mụọ foto na Graduate Center nke Mahadum City nke New York . [2] Alaoui chere na ịmụ ihe na United Steeti nyere ya ohere "ịghọ ọbụna n'ahụkarị ajụjụ banyere ịbụ onye na ịmepụta njirimara". [6] Ọ laghachiri mba Morocco n'afọ 2008.[2] Ọ gakwara Mahadum Hofstra site n'afọ 2000 ruo 2003.
<ref>
tag; name "shearlaw-guardian" defined multiple times with different content
<ref>
tag; name "auto" defined multiple times with different content