ụdịekere | nwanyị ![]() |
---|---|
mba o sị | Angola ![]() |
aha ezinụlọ ya | Pereira ![]() |
ụbọchị ọmụmụ ya | 9 Ọktoba 1987 ![]() |
Ebe ọmụmụ | Angola ![]() |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Portuguese ![]() |
ọrụ ọ na-arụ | model, onye asọmpi ịma mma, omee, oko akuko ihe onyonyo ![]() |
Ihe nrite | Africa Movie Academy Award for Best Actress in a Leading Role ![]() |
Lesliana Massoxi Amaro Gomes Pereira, nke a maara dịka Lesliana Pereira, bụ onye Angola na-eme ihe nkiri, ihe nlereanya na onye mmeri nke asọmpi ịma mma. E chiri ya okpueze Miss Angola n'afọ 2007. Ọ gara n'ihu na-anọchite anya mba ya na Miss Universe 2008, mana o nwetaghị. N'afọ 2014, ọ pụtara na ihe nkiri Njinga: Queen Of Angola, ọrụ nke mere ka ọ bụrụ onye na-eme ihe nkiri kacha mma na 11th Africa Movie Academy Awards.
A mụrụ Pereira n'obodo Soyo na Angola.[1][2]
Pereira bụ Miss Angola n'afọ 2007 ma nọchite anya mba ya na Miss Universe 2008.[3][4] Ya na onye mmeri Miss Universe, Leila Lopes, a gbara Periera ajụjụ ọnụ na ihe ngosi TV Portuguese a ma ama Programa do Jô .[5]
Ọ gara nyocha megide Erica Chissapa maka ọrụ na ihe nkiri Xuxa Meneghel, Xuxa na Mystery of Feiurinha . O mechara nweta ọrụ Fadona na ihe nkiri ahụ, nke e wepụtara n'ọnwa Jenụwarị afọ 2010. Ihe nkiri ahụ nwere ihe ịga nke ọma n'ahịa, ma ree karịa Avatar n'izu mbụ ya na Angola.[6]
Ọrụ Pereira na ihe nkiri akụkọ ihe mere eme nke afọ 2014, Njinga: Queen Of Angola gbara ya ka ọ pụta ìhè. Ihe nkiri ahụ na-akọ akụkọ banyere otu Eze Nwanyị Angola si nwee ọnọdụ na-emegide ndị nwe ala.[7] E gosipụtara ihe nkiri ahụ n'ọtụtụ mba gụnyere London. N'oge emume ihe nkiri nke Film Africa, ọnụ ọgụgụ tiketi achọrọ maka ihe nkiri ahụ karịrị oche ndị dịnụ. Ndị na-ahazi ihe nkiri ahụ aghaghị ịkwaga n'ime ụlọ buru ibu iji nabata ndị na-ekiri ihe nkiri ahụ.[1]
Ihe nkiri ahụ abụghị naanị na ọ na-aga nke ọma n'ahịa kamakwa ọ nwetara ihe nrite ya gụnyere Best Actress na 11th Africa Movie Academy Awards.[8][9]
Nke a emeela ka a gbaa ajụjụ ọnụ dị elu na ihe ngosi TV Britain a ma ama, Arise News na ya na-eduga akụkọ maka Revista Africa nke Globo Internacional. Dịka akụkụ nke ọrụ mmekọrịta ya, ọ na-akwado n'ihu ọha maka mmata na nchebe megide HIV / AIDS.[10][11]
N'afọ 2015, Pereira rụrụ ọrụ na ihe nkiri Brazil I Love Paraisópolis .[12]
<ref>
tag; name "angonoticiasDec14" defined multiple times with different content