aha | Lionheart |
---|---|
ụdị | drama film |
location of first performance | Toronto International Film Festival |
ndi mgbasa ozi | Netflix, YouTube |
mba osi | Naijiria |
Mmalite asụsụ ihe ngosi | Bekee |
afọ/ụbọchị mbipụta | 2018, 7 Septemba 2018, Disemba 2018 |
ụbọchị mmepụta | 2018 |
Onye nduzi | Genevieve Nnaji |
Odee akụkọ ihe nkiri | Genevieve Nnaji, Ishaya Bako, Chinny Onwugbenu |
executive producer | Genevieve Nnaji, Chinny Onwugbenu |
onye na-emepụta ihe | Chinny Onwugbenu |
Ụbọchị nke mbụ arụmọrụ | 2018 |
ebe akụkọ | Naijiria |
Ụcha anụkpa ahụ | color |
Nyocha akara | 100%, 6.3/10 |
ahọpụtara maka | International Submission to the Academy Awards |
usoro nkesa | video on demand, DVD, Blu-ray Disc |
Kijkwijzer rating | 6 |
ụbọchị ọkwa | Septemba 2018 |
Lionheart bu ihe nkiri ejije nke Naijiria nke 2018 nke Chinny Onwugbenu mebere ma Genevieve Nnaji duziri ya. Ndi so n'ejije a bụ Pete Edochie, Genevieve Nnaji na Nkem Owoh . Netflix nwetara ya na 7 Septemba 2018, [1] eme ya ihe nkiri Netflix mbụ emere na Naịjirịa . [2] Lionheart malitere na 2018 Toronto International Film Festival na Canada. [3] Ihe nkiri a bụ izizi mbụ nke Nnaji [4] yana nke Peter Okoye na Chibuzor Azubuike (nke a makwaara dị ka Phyno ). [5] Emepụtara fim ahụ na ụwa niile na 4 Jenụwarị 2019 na Netflix. [6]
A họpụtara Lionheart dika ihe nkiri si Nigerian maka Best International Feature Film na 92nd Academy Awards.[7] Ọ bụ mbụ Nigeria na ewega ihe nkiri na Oscars.[8] N'abali anọ n'ọnwa Novemba 2019, Academy a gụpụrụ ihe nkiri a maka asụsụ ejiri mee ya kariri na Bekee [9] nani nkeji iri ka asụrụ Igbo na ya.[10]
Lionheart na- akọ akụkọ Adaeze Obiagu (nke Nnaji gosipụtara), onye chọrọ ịnọchi nna ya, Chief Ernest Obiagu ( Pete Edochie ), mgbe ọ na-enweghịzi ike ịrụ ọrụ n'ụlọ ọrụ ya n'ihi nsogbu ahụike. Otú ọ dị, nna ya na-arịọ nwanne ya nwoke bụ Godswill ( Nkem Owoh ) ka o were ọnọdụ ya, na Godswill na Adaeze ga-arụkọ ọrụ ọnụ iji chekwaa ụlọ ọrụ ahụ na ụgwọ nakwa iyi egwu iwepụ nke onye ọchụnta ego Igwe Pascal ( Kanayo O. Kanayo ).
E mepụtara ihe nkiri ahụ site n'aka Chinny Onwugbenu maka MPM Premium na mkpakọrịta The Entertainment Network. Netflix nwetara ikike ikesa ihe nkiri a na mba ụwa na 7 Septemba 2018, otu ụbọchị tupu amalite izi ya na 2018 Toronto International Film Festival . [11] [12] [13]
E mepụtara usoro na atụmatụ ihe nkiri ana 24 August 2018. [14] Na 4 Jenụwarị 2019, ewepụtara ihe nkiri ahụ ka mba ụwa nwee ike ile ya na Netflix. [6]
Lionheart anatawo nlebara anya dị mma site n'aka ndị nkatọ dị iche iche. Na nyochaa mkpokọta Rotten Tomatoes , ihe nkiri a nwere nkwenye nnabata 100% yana akara ngosi nke 6.33 / 10 dabere na nyocha asaa. [15] Nollywood Reinvented kpọtụrụ aha na nyocha ha banyere ihe nkiri a na ọ "na-arụ ọrụ n'ihi na o bara ha n'obi", [16] na ọnụego ihe nkiri a dị na 61%. Womentainment lebara anya na onye kachasi ipụta ihe na onye nduzi, Genevieve Nnaji, na-atụ aro ka ndị mmadụ lelee ya "maka nwanyị dị egwu nke bụ onye kachasi ipụta ihe ma bụkwa onye na-eduzi". [17] Nollywood Post gara n’ihu na-aja Genevieve Nnaji mma na nyocha ya: “Lionheart bụ akụkọ na-enye afọ ojuju ịkọ maka ịkwado ụmụnwaanyị n’enweghị oke isiokwu.” [18]
Ka ọ dịgodị, ihe nkiri ahụ nwetakwara nyocha ole na ole na-adịghị mma n'ihi ihe ụfọdụ ndị chere dị ka atụmatụ "enweghị ezi uche". Ntụleghachi na Nairametrics kwuru na ndị dere / ndị na-emepụta ihe nkiri ahụ emeghị nchọpụta nke ọma na usoro ụlọ ọrụ tupu ha emee ihe nkiri a. N'ihi ya, e mere ụfọdụ iberiibe. [19]