Mabel Hardie (1866-1916) bụ onye dọkịta na-awa ahụ na Britain. Ọ bụ dọkịta na-awa ahụ n'agha n'ụlọ ọgwụ ụmụ nwanyị nke obodo Scotland ma kpọọ aha ya na akwụkwọ nsọpụrụ Mbụ nke Agha Ụwa.[1]
A mụrụ ya bụ Hardie n'afọ 1866 na Marple, mgbe ahụ na Cheshire, England.[2][3]
Hardie gụrụ Sayensị Okike na Girton kọleji, Mahadum nke Cambridge, n'etiti 1887 na 1890. N'ihi ọrụ ya na Cambridge, Trinity kọleji Dublin nyere ya onyinye MA wee gaa n'ihu na-azụ dị ka dọkịta na Mahadum Glasgow, na-agụsị akwụkwọ na MB ChB . [3][4]
Mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ, ọ bụ dọkịta na-awa ahụ n'ụlọ na Ụlọ ọgwụ Belgrave maka ụmụaka, dọkịta n'èzí na dọkịta ụlọ na Ụlọ ọgwụ Leith, na dọkụ ụlọ na-awa ahụ na Ụlọ ọgwụ Glasgow Samaritan maka ụmụ nwanyị. N'ọnwa Nọvemba n'afọ 1907, mgbe ọ gachara njem, ọ gara ọrụ na Hampstead.[4]
Ọ bụ onye otu ana akpo West London Ethical Society, onye bu ụzọ na Humanists UK.[5] Ọ jụrụ ịkwụ ụtụ isi ma mee ka a na-ere ya ọlaedo na foto ya.[6]
E jidere ya maka ime ngagharị iwe iji kwado ikike ụmụ nwanyị.[2][3]
Mgbe Agha Ụwa Mbụ tiwapụrụ, ọ sonyeere Girton na Newnham nke Ụlọ Ọgwụ Ụmụ nwanyị Scotland, nke na-agwọ ndị agha na-arụ ọrụ na obodo France. Ọ rụrụ ọrụ na Troyes na Northern France mana ọ laghachiri na London n'ihi ahụike na-adịghị mma. Ọ nwụrụ n'Ọrịa kansa ara n'afọ 1916.[3][7]
<ref>
tag; name ":1" defined multiple times with different content
<ref>
tag; name "Girton" defined multiple times with different content
<ref>
tag; name ":0" defined multiple times with different content