ụdịekere | nwoke |
---|---|
mba o sị | Tunisia |
aha n'asụsụ obodo | مجد مستورة |
aha enyere | Majd |
ụbọchị ọmụmụ ya | 30 Eprel 1990 |
Ebe ọmụmụ | Menzel Abderrahmane |
ọrụ ọ na-arụ | omee |
oge ọrụ ya (mmalite) | 2014 |
Ihe nrite | Silver Bear for Best Actor |
Majd Mastoura bụ onye Tunisia na-eme ihe nkiri na onye ntụgharị. Na 66th Berlin International Film Festival ọ meriri Silver Bear maka onye na-eme ihe nkiri kacha mma maka ọrụ ya na ihe nkiri Hedi .[1][2][3]
A mụrụ Majd Mastoura na Menzel Abderrahmane, Bizerte, nna ya bụ onye agha ebe nne ya bụ onye nkuzi Arabic. Site na nwata Mastoura gosipụtara ihe nkiri, akwụkwọ na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ọ bụ onye na-agụ akwụkwọ nke ọma. Khalil Gibran na Naghib Mahfouz so n'ime ndị ọkacha mmasị ya.
N'afọ 2012, ọ malitere ihe omume okwu mbụ na mba ya, nke ọ kpọrọ "Okwu Okporo ámá". Ya na ezigbo enyi ya Amine Gharbi rụrụ ọrụ na ihe omume ndị a. Ihe omume ndị a gara n'ihu ruo n'afọ 2014, nke gosipụtara mbipụta ikpeazụ nke "Okwu Okporo ámá".[4]
N'afọ 2013, e nyere Majd ọrụ mbụ ya na Bidoun 2, nke bụ ihe nkiri izizi ya.[5] N'afọ 2015, Majd nyochara maka ọrụ Hedi, nke ọ bịarutere ma mesịa nye ya Silver bear na 66th Berlinale.[6]
Majd na-edekwa akwụkwọ na Tunisian Arabic (derja) dịka ụzọ isi gosi nkwado nye ndị obodo ya. Na mbido, o debere ihe odide ya n'onwe ya, mgbe ahụ ọ malitere itinye ha na asọmpi edemede n'afọ 2009.[4]
Ọ sụgharịrị akwụkwọ nkà ihe ọmụma French La chose publique n'asụsụ Tunisian.[7] Ọ na-akọwa nhọrọ ya ịsụgharị gaa n'asụsụ Tunisian Arabic (kama Standard Arabic) site na mmekọrịta mmetụta uche ya na asụsụ ahụ (nke a na-akpọ ebe a dārja, nke pụtara "ihe a na-ahụkarị"): "Mmekọrịta m na Tunisian dārja dịka nke onye ọ bụla Tunisian, ana m ekwu na dārja, ana m eche na dārja. " Ọ na-akọwa na, ọ bụ ezie na French na Arabic Standard bụ akụkụ nke asụsụ ya, "mgbe ọ bụla okwu si n'ọnụ m pụta na mberede site na ijuanya ma ọ bụ nkụda mmụọ ma ọ bụ obi ụtọ ma ọ bụ ihe mgbu na-apụta na dārja. "[8]