ụdịekere | nwanyị |
---|---|
mba o sị | Njikota Obodo Amerika |
aha enyere | Margaret |
aha ezinụlọ ya | Leinen |
ụbọchị ọmụmụ ya | 20 Septemba 1946 |
ọrụ ọ na-arụ | oceanographer, geologist, environmentalist |
ụdị ọrụ ya | oceanography, paleoceanography, Paleoclimatology |
onye were ọrụ | University of California, San Diego, Scripps Institution of Oceanography, University of Rhode Island, Ụlọ ọrụ ngalaba sayensị |
ebe agụmakwụkwọ | University of Illinois system, University of Rhode Island, United States Army War College, Oregon State University |
Ebe ọrụ | La Jolla |
Onye òtù nke | American Academy of Arts and Sciences |
Ihe nrite | Fellow of the Geological Society of America, Fellow of the American Association for the Advancement of Science, Fellow of the American Academy of Arts and Sciences, Ambassador Award |
Margaret Leinen (amụrụ n'ọnwa Septemba ụbọchị iri abụo, n'afọ 1946) bụ ónyé American paleoceanographer na paleoclimatologist. N'afọ 2013, a họpụtara Leinen dịka ónyé nduzi nke iri na otu nke Scripps Institution of Oceanography, yana ónyé isi nke School of Marine Sciences na Mahadum California, San Diego.[1] O guzobere Climate Response Fund, ụlọ ọrụ na-enweghị uru nke lekwasịrị anya n'ime ka nghọta ka mma, nhazi na iji nyocha injinia ihu igwe mee ihe, ma jee ozi dị ka ónyé isi oche ya ruo oge ụfọdụ. Ruo afọ abụọ, Leinen rụkwara ọrụ dị ka ónyé isi sayensị màkà ụlọ ọrụ na-amalite na teknụzụ ahịhịa ndụ na mbelata mgbanwe ihu igwe.[2]
N'afọ 1969, Leinen nwetara nzèrè bachelọ nkè sayensị na Geology na Mahadum Illinois, nzèrè masta na geological oceanography na Mahadim Oregon State n'afọ 1975, na nzèrè doctorate ya na oceanography n'afọ 1980 na Mahadị Rhode Island.[3]
A họpụtara ya ka ọ bụrụ ónyé otu American Association for the Advancement of Science[4] na nkè Geological Society of America.[5] N'afọ 2016, Ngalaba Na-ahụ Maka Ọchịchị United States họpụtara ya dị ka ónyé nnọchi anya sayensị US.[6] N'afọ 2020, a họpụtara Leinen na American Academy of Arts and Sciences[7][2] ma kpọọ ya ónyé otu The Oceanography Society.[8]