Mbelata Mgbasa Ihe Mgbapụta - Voluntary Emission Reductions ma ọ bụ Verified Emission Reduktions (VERs) bụ ụdị carbon offset gbanwere na ahịa afọ ofufo ma ọ bụ n'elu ahịa màkà ego carbon.[1] A na-enwekarị asambodo nkè mbelata ikuku a kwadoro site na usoro asambodo afọ ofufo.[2]
A na-emekarị ka mbelata nké ikuku a kwadoro site na ọrụ ndị a kwadoro n'èzí Kyoto Protocol. Otu VER bụ otu tọn nke CO2 na-ewepụta.[3] Site na atụmatụ ndị a, ụlọ ọrụ na ndị mmadụ n'otu n'otu na-akwụ ụgwọ màkà ikuku ha ma ọ bụ nye ònyìnyé ọzọ iji belata mgbanwe ihu igwe.
Enwere ike ịmepụta VERs ma gbakọọ ya na otu n'ime ọtụtụ ụkpụrụ VER. Ndị a setịpụrụ iwu na-akọwa etu esi atụ mbelata nke ikuku. Ụkpụrụ na-enye mmesi obi ike màkà ndị na-azụ VERs.[4] Ọ dịkarịa ala, ónyé nke atọ nwere onwé ya kwesịrị ịnwapụta VERs niile.[5]