ụdịekere | nwoke |
---|---|
mba o sị | Naijiria |
aha enyere | Mohammed |
ụbọchị ọmụmụ ya | 11 Novemba 1955 |
Ebe ọmụmụ | Kaduna Steeti |
ọrụ ọ na-arụ | Onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị |
Ọkwá o ji | onye otu ndi omeiwu nigeria |
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị | Nzukọ maka Mgbanwe Na-aga n'ihu |
Mohammed Sani Saleh bụ onye ọchịagha lara ezumike nká na onye bụbu onye nnọchi anya Senator na-anọchite mpaghara etiti Kaduna na ọgbakọ mba dị na Abuja. Naịjirịa, a họpụtara ya n'ụbọchị itoolu n'ọnwa Eprel 2011 n'oge ntuli aka mba na okpuru otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị Congress for Progressive Change (CPC). [1]
Na ntuli aka nke ụbọchị itoolu n'ọnwa Eprel afọ 2011, ndị ọmụma aka Saleh bụ onye odeakwụkwọ ukwu nke Ego mmepe teknụzụ mmanụ ala, Hamisu Yusuf Abubakar (Mairago) nke otuPeople's Democratic Party (PDP), na Hajia Halima Aminu Turaki nke otu Action Congress of Nigeria (ACN) . [2] Mgbe ekwusịrị onye mmeri ntuli aka, Saleh toro Independent National Electoral Commission (INEC) maka omume ntuli aka ahụ, na-ekwu na "ọ rụọla ọrụ nkwenye nke ọma n'oge a, dị mma nke ukwuu, enwere m olileanya na a ga na-eme ya na ntuli aka ndị ọzọ." [3]
N'oge ntuli aka onye isi ala na n'ụbọchị iri na isii nke ọnwa prel afọ 2011, e nwere mbọ ndị ntorobịa nọ na Kaduna kpalitere mgbe osote onye isi ala Namadi Sambo nke PDP rutere ebe a na-eme ntuli aka ịtụ vootu. Saleh kwadoro ndị isi na igbochi ihe ahụ merenụ, na-ekwu "Anyị ga-asọpụrụ ikike emebere. Ọbụnadi ọdịnala anyị gwara anyị ka anyị sọpụrụ ndị okenye anyị ”. O tokwara etu ntuli aka ahụ si gaa, na-akọwa ya dịka ihe nlere anya. [4]