ụdịekere | nwanyị |
---|---|
mba o sị | Jamaikạ |
obodo maka egwuregwu | Jamaikạ |
Aha enyere | Nadia |
aha ezinụlọ ya | Davy |
ụbọchị ọmụmụ ya | 24 Disemba 1980 |
Ebe ọmụmụ | Jamaikạ |
ọrụ ọ na-arụ | sprinter |
ebe agụmakwụkwọ | Bridgeton High School |
ụdị egwuregwu | egwuregwu |
ịdọ aka ná ntị egwuregwu asọmpi | 400 metres |
so na | 2004 Summer Olympics |
Nadia Davy (amụrụ na 24 Disemba 1980) bụ onye na-agba ọsọ na Jamaica American, na-asọ mpi mba ụwa maka Jamaica. Ọ bụ Onye nwetara ọla nchara na 4 x 400 mita relay n'afọ 2004 egwuregwu ịgba ọsọ Olympic na Athens, Gris.
A mụrụ Davy na Jamaica mana o toro na Bridgeton, New Jersey. [1] Ọ gụpuru akwụkwọ na Bridgeton High School, ebe ọ gbara ọsọ, na 1999. [2] Ọ tinyere ihe ndekọ Bridgeton High School na mita 400 na oge nke 54.04 sekọnd. O nwetara utu aha na steeti isii n'ụlọ akwụkwọ sekọndrị, gụnyere ndị egwu ọgbụgba ọsọ na 1999 n'ime ụlọ na ezi na asọmpi 400 mita.
Davy gara Mahadum Steeti Louisiana iji gbaa ọsọ mgbe ọ gụchara akwụkwọ sekọndrị. Ọ bụ onye nke asaa nke America niile na LSU ma ugbu a o ji ihe ndekọ
ụlọ akwụkwọ [3] na mita 400 nke ụmụ nwanyị na oge nke 50.66 sekọnd, nke otinyereụ na 2003 na obere afọ ya. [4]
Davy ruru eru ịgba maka [5] egwuregwu Olympic nke Jamaica n'afọ 2004 mgbe ọ nwetara ọkwa mbụ na mita 400 (50.76 sekọnd) na asọmpi JAAA / Supreme Ventures National Senior na Kingston, Jamaica.
Davy gbara ọsọ ihe omume abụọ na Atens, 400 mita nke ofu onye na 4x400 mita relay. Na mita nke 400, ọ gbara ọsọ nke 52.04 sekọnd ma ọ bụghị ebe.
O riri ọla nchara maka 4 x 400 mita relay (3:22:00). Davy nyere oge nke 50.24sekọnd n'oge ọgbụgba ọsọ nke atọ.
Davy [6] ebighị zi na Bridgeton, New Jersey ebe ọ rụrụ ọrụ na ụlọ akwụkwọ sekọndrị ya dị ka onye enyemaka na onye enyemaka onye nkuzi ịgba oso. O nwere nwa nwoke na nwa nwanyị. O nwekwara nzere masta ya na ndụmọdụ na Mahadum Wilmington dị na Delaware.