ụdịekere | nwanyị ![]() |
---|---|
mba o sị | Njikota Obodo Amerika ![]() |
aha enyere | Nia ![]() |
ụbọchị ọmụmụ ya | 20. century ![]() |
Ebe ọmụmụ | East Oakland ![]() |
ọrụ ọ na-arụ | astrophysicist, omenkà ![]() |
onye were ọrụ | Harvard–Smithsonian Center for Astrophysics ![]() |
ebe agụmakwụkwọ | Kenyon College, University of California, Berkeley ![]() |
onye ndụmọdụ doctoral | Leo Blitz ![]() |
webụsaịtị | https://www.niaimara.com/ ![]() |
nnọchiaha nkeonwe | L484 ![]() |
Nia Imara bụ ónyé America na-ahụ màkà ihe ndị dị na mbárá igwe, onye na-ese ihe, na ónyé na-eme ihe ike. Ọrụ sayensị nke Imara na-ekwu màkà ụyọkọ kpakpando, mmepụta kpakpando na nchọpụta mbara ala. Imara bụ nwanyị Africa America mbụ nwetara PhD na astrophysics na Mahadum California, Berkeley ma bụrụkwa ónyé mbụ postdoctoral fellow na mmemme Future Faculty Leaders na Mahadim Harvard.[1][2] N'afọ 2020, Imara sonyeere Mahadum California, Santa Cruz dị ka onye enyemaka Prọfesọ na Ngalaba Astronomy.[3]
A mụrụ Imara na East Oakland, Oakland, California ma too na San Francisco Bay Area.[4] Ọ natara nzèrè bachelọ ya na Kenyon College n'afọ 2003, na-agụ akwụkwọ na mgbakọ na mwepụ na physics.[5][4] Mgbè ọ nọ na Kenyon College, ọ na-asọ mpi na otu igwu mmiri nke kọleji.[6] Ọ kwagara Mahadum California, Berkeley màkà ọmụmụ postgraduate ya, na 2010 ọ ghọrọ nwanyị Africa America mbụ nwetara PhD na astrophysics na Mahadum Californie, Berkeley.[4] Akwụkwọ édémédé ya bụ na The Formation and Evolution of Giant Molecular Clouds ma Leo Blitz lekọtara ya.
Site na 2014 ruo 2017, Imara bụ ónyé mbụ postdoctoral fellow na mmemme Future Faculty Leaders na Mahadum Harvard. Nnyocha postdoctoral ya lekwasịrị ányà na nnukwu igwe ojii, ébé ọmụmụ kpakpando, na njirimara na mmetụta cosmological nke ụyọkọ kpakpando na ntụ intergalactic.[2] O jiri telivishọn redio kachasị ukwuu n'ụwa, Robert C. Byrd Green Bank Telescope, mee nchọpụta ya.[4]
Imara bụ ónyé na-akwado ikpe ziri ezi na STEM. O guzobere Equity and Inclusion Journal Club na Mahadum Harvard na 2018 nke ya na Dr. Anna Pancoast haziri na mbụ.[7] Ọ gàrà South Africa na Ghana iji kụzie ma kwado na mmemme ndị e mèrè iji mụbaa ọdịiche dị iche iche na mbara igwe na mpaghara STEM ndị ọzọ.[8][9]